N’Enugu, akọwaala Sista Martina dịka Mother Theresa nke oge a

0
41

ULOAKWỤKWỌ ndị enweghị nne n anna, tinyere ụmụaka a gbahapụrụ agbahapụ, ndị nke a tụụtara ọtụtụ n’ime ha n’akụkụ ụzọ, emeela emume ncheta afọ iteghete e hibere ya. O bụ otu nwaanyi onye steeti Anambra chiri echichi ụka (Nun) Rev. Sista martina Oforka hibere ụlọakwụkwọ ahụ ma bụrụkwa ya tụtụtara ụfọdụ ụmụaka ahụ n’akukụ ụzọ.

Sista Oforka, onye ‘nun’ obara na-agba (stigmatic nun) n’obeaka abụọ na n’egedege ihu oge ncheta afụfụ na ọnwụ dịka Jesu Kristi oge a na-akpọgbu ya n’obe na Calvary, gbasoro usoro pụrụ iche n’echichi ụka o chiri oge ọ lara n’ime ime obodo na Nsukka ọtụtụ afọ gara aga.

N’afọ 2012, o hibere ụlọakwụkwọ ebe ụmụaka ndị ahụ ụwa na-atụ n’ọnụ ga na-agụ akwukwo, Divine Wounds School, bu nke nwerela ngalaba kọleeji ugbu a ; ebe ndị ọzọ bi n’obodo ahụ na gburugburu ya kpọtachara ụmụ ha ma debanye aha ha n’ụlọakwụkwọ ahụ.

N’oge emume e mere iji cheta ogbụgba afọ iteghete nke ụlọakwụkwọ ahụ, Sista Martina na ụmụakwukwo ya mere ihe ka o kpoo oku site n’igosi ụwa na ihe a muru amụ ka ihe a gụọrọ agụọ.

Dika ọ na-akọwa otu o siri malite ụlọakwụkwo ahu, ebumnuche o jiri hibe ya afọ iteghete gara aga n’Umụagbedo Agu, Amachalla, Enugu-Ezike bụ sọọsọ maka inyere ndị enwe nne na nna nọ n’ogige ha aka, ya na ndị a na-emegbu emegbu, tinyere ndị enweghi onye ga-elekọta ha anya, aka ka ha wee nwee ike igụ akwụkwọ dịka ụmuaka ndị ọzọ nwere isi ọma bụ ndị nne na nna ha na-azụ.

O kwuru si na n’otito nke Chukwu, otụtụ nne na nna malitere na-akpọta ụmụ ha n’ụlọakwụkwọ ahụ maka idebanye aha ha. ọ kọwakwara na e hibekwara ngbakwunye/ngalaba ọzọ (extension) nke ụlọakwụkwọ ahụ n’obodo ọzọ, Ogbodu. Sista Martina gara n’ihụ keele ndị nkwado ha, bụ ndị nke sitere n’ụzọ dị iche iche tụnye ụtụ iji bulie ụlọakwụkwọ ahụ n’ogo ọ nọ ugbu a.

ọ kọwara na ụlọakwụkwọ ahụ agbaala mbọ n’ihe banyere agụmakwụkwọ dịka ituru ugo n’ule WAEC na NECO na nke mbụ na mbụ ya, n’afọ 2018/2019. O kwuru na ụlọakwụkwọ ahụ na-aga n’ihu na-egosipụta ihe ọ bụ ma n’ule ime na nke ebe ọzọ (internal and external; examinations) n’etinyeghị aka n’igwu ojoro obula ruo taa dịka ha na-azụlite ụmụakwụkwọ n’ime mmụọ ma buru ndi na-eme nke ọma n’ụlọakwọ dị elụ dị iche iche.

Otu o sila dị, ọ rụtụrụ aka banyere ọtụtụ ihe iche aka mgba ha nwere dika ịrụpụtakwa ọnụụlọ klaasị (classrooms), ịnwetakwụ akọrọngwa komputa, ụlọ ebe obibi ụmụakwụkwọ, ịrụ ọwa mmiri iji haziere mmiri ụzọ o si aga n’ihu ụlọakwụkwọ ahụ, n’Umụagbedo Agu tinyere igwe na-enye ọkụ ga-enwe ike ibunwu ihe niile. Ha chọkwara enyemaka iji wulite ọbaakwụkwọ ha n’ogo di elu, ụgbọala bọọsụ na akọrọngwa egwuregwu.

Otu n’ime ndị mbụ na-akwado ụlọakwụkwọ ahụ,  Francis Uja kọwara Sista Martina dịka onye Chineke jiri kwara ngwa oru.

O kwuru na ihe gbasara agumakwụkwọ bụ otu n’ime ihe Chineke jiri zite Sista ahụ n’uwa, ma rụtu aka na ọ gbara gharịị otu o siri nwee ike na-elekọta ndụ mmụọ, ahụike na erimeri ụmụaka ahụ nọ n’okpuru ya, tinyekwara nnwereonwe nke ime mmụọ nke o wetere n’ebe ọtụtụ ezinaụlọ nọ mkpagbu di iche iche n’ụwa. Ya mere, ọ kpọkuru gọọmenti ka ha gbatara Sista ahụ ọsọ enyemaka na mbọ ọ na-agba.

Otu ụkọchukwu Katolik n-agụ akwukwọ na Rome, Fada Peter Nnaji kọwara Sista Matina dịka Mother Theresa nke oge a. O gosiputara afọ ojuju o nwere n’oganihu ebe ahụ. Ufọdụ ndị bịara emume ahụ gbara ama na site n’ihe ha hụrụ ebe ahụ, na e nwere ezi olile anya dị mma n’ebe ala anyi na ụka nọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here