Okafor akpọkuola ndị Anambra bi mba Ofesi ka ha wèlatruo akụ ha ụlọ

0
35
Uche Okafor (nke abụọ n'aka ekpe) na ndị soro ya wee gaa njem nleta ọrụ ahụ

ỌKAOKWU ụlọomeiwu steeti Anambra, bụ Maazị Uche Okafor akpọkuola ụmụafọ steeti Anambra nọgasị mba ofesi ka ha welataruo akụnụba ụlọ site n’ịbịa rụọ ụlọọrụ, ụlọ mmepụta ngwaahịa, maọbụ ihe mwunye ndị ọzọ, iji nye aka kwàlitekwuo ọnọdụ mmepe steeti ahụ.

Maazị Okafor kpọrọ oku a oge ọ gara njem nleta n’ebe ahụ a na-arụ agadada ogige ụlọahịa ‘Akaeze Multi Services’, bụ nke a na-arụ n’Awka site na njikọaka ụlọọrụ na-ahụ maka nkwàlite ewumewu ụlọ na steeti Anambra.

O tòrò ọrụ ahụ nà ogoogo e ji arụ ya, kwupụta afọojuju ya banyere ya bụ ogige a na-arụ, ma kelekwa onye na-arụ ogige ụlọahịa ahụ maka iwelataru akụnụba ya ụlọ. O kwuru na nke ahụ dabara adada n’oku ‘Akụ Ruo Ụlọ’ ahụ Gọvanọ Obianọ na-akpọ ndị Anambra bi na mba ofesi na ndị bi na steeti dị icheiche.

O kwuru na a rụchaa ya bụ ụlọahịa, na ọ ga-enye aka ikewàpụta ohere ọrụ nye ụmụafọ steeti ahụ, ọkachasị ndị ntorobịa, tinyere ọtụtụ uru ndị ọzọ ọ ga-ewèta. O kelekwara aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Obianọ maka ịdọtasị ndị ojiego achụ ego n’ime steeti ahụ site n’ime ka e nwee ezi ọnọdụ dị larịị maka ndị ojieego achụ ego na nkwalite ezi ọnọdụ akụnụba.

O kwuru na ndị ahụ na-arụ ogige ahụ enwetela akwụkwọ niile na nkwàdo niile ha kwesiri inwete maka ọrụ ahụ ha na-arụ, ma kelekwa òtù ọrụ na-ahụ maka ọrụ n’ụlọ omeiwu ahụ, maka ịhụ na a na-arụ ya bụ ogige ụlọ ahịa n’ogoogo kwesiri ekwesi.

Na ntụnye nke ya, onyeisi ụlọọrụ ‘Anambra State Housing Development Corporation’, bụ Maazị Willie Okafor nyere nkọwa banyere ya bụ ogige ụlọahịa

GUO:  Speaker Anambra emeela ncheta ọmụmụ ya, kesàárà ndị Ayamelum ihe nkwàdo

Dịka o siri kọwaa, eserese ụlọ ahụ nwere ebe a na-egwu mmiri, ebe a na-emesapụ ahụ, ebe a na-elele onyoonyoo, ebe a na-ere nri, ebe a na-eregasị ụfọdụ ihe dị icheiche, tinyere ihe ndị ụzọ dị icheiche a na-eme n’ogige ahụ.

Ọ gbakwara akaebe na ya bụ ogige ụlọahịa ga-enye aka ịkwàlitekwu na ime ka mma nke Awka bụ isi obodo steeti Anambra chawapụtakwuo.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here