Igba odibo: Usoro obibi ndụ ndị Igbo (1)

0
34

NDỊ IGBO kwuru okwu si na onye fee eze, eze efee ya. O were buru ya, igba odibo so n’otu usoro obibi ndụ ndị Igbo. Onye gbachaa odibo, n’ikpeazụ o nwere onwe ya, zụba ndị ọzọ.

  Igba odibo di n’ụzọ dị iche iche, ufọdụ na-agba odibo maka inye aka n’ọrụ ezinaụlọ, ụfọdụ na-agbakwa odibo ahia nke a na-akpọ ịgba ‘bọyị’ n’ala Igbo. Otu o sila di, odibo bụ mmadu ịnọ n’okpuru onye ọzọ na-eme ihe na ntuziaka onye ọ nọ n’okpuru ya.

  A bịa n’igba odibo maka ọrụ ezinaụlọ,  ọtụtụ ụmụaka bido n’ihe dika agbata afọ ise ka a na-akpọpụ. Ụmụaka dị otu ahụ na-ahapu ezinaụlọ nne na nna ha were gaa na nke onye ha ga-agbara odibo. ọtụtụ n’ime ha na-eku nwa, otụtụ na-esi nri, ọtụtụ na-elekọta ndị okenye, tinyere ihe ndọ ọzọ.

  Ụmụaka gara iku nwa na-anọ n’ụlọ ebe ahụ ha na-agba odibo kuo nwa, ha kuchaa ọ bụrụ na ọ dabara ha na ndị ha na-agbara odibo, ha ekuru nwa na-aga n’ihu. Ụfọdụ n’ime ha na-eku ụmụ abụọ, atọ, anọ maọbu karia. Ka ha na-eku ụmụaka ahụ, ha kwesiri idi na-agakwa akwụkwọ. Tupu ị mara ihe na-eme ha anọrọ ebe ahụ gụọ prịma na kọleeji, ebe ụfọdụ na-aga mahadum.

O nwere  di na nwunye na-arụ ọrụ oyibo, nwatakịrị ha kpọtara ka ọ gbaara ha odibo site n’ikuru ha ụmụaka nọ be ha gụchapụ akwụkwọ. Ha zụrụ ya na mahadum, mgbe ọ guchara ma turu ugo, nwanne nna ya ukwu bịara lụrụ ya. N’uzo dị otu  ahụ, ezinaụlọ abụọ ahụ abụrụla nwanne maka na ogọ bụ ikwu atọ. Ma otu o sila dị, ọ bụ ụmụaka nwere nsọpụrụ na irube ise na-enweta udị ihu ọma ahụ maka na Igbo kwuru si na onye ndidi na-eri azụ ukpoo.

GUO:  Igba odibo n'oge ugbua

  N’aka nke ọzọ, ọtụtụ ụmụaka na-anọ n’ụlọ mmadụ na-eje ozi ụlọ bido n’ụtụtụ ruo n’abalị. Ha ga-eku nwa, sie nri, kpochaa ụlọ, sụọ akwa, jee ahIa, tinyere ihe ndị ọzọ. N’ikpeazụ, o nweghi ihe a ga-emere ha, anaghị azụ ha n’akwụkwọ kama a na-akwụ nne na nna ha maọbụ onye kpọtara ha ugwọ, ọnwa ọbụla.

  Ụfọdụ ụmụaka ndị danyere n’aka ndị ọjọọ  na-ata oke ahụhụ. Ufọdụ n’ime ha ka e ji atụ mgbere, ha si be onye a pụta ha agaa be onye nke ọzọ. Ọtụtụ ka a na-ebunye ahịa ha a na-akwugharị n’okporoụzọ na ahịa, tinyere ọdụụgbọala dị iche iche, ọtụtụ n’ime ha na-esite n’ụzọ dị otu  ahụ tụrụ ime mkpuke, ebe ọtụtụ na-ezute ihe ike, si otu ahụ tụfuo ndụ ha. Ufọdụ esila n’ụzọ enweghị ezi ọzụzọ mụta izu ohi, ghọọ omekome.

ụfọdụ umuaka na-agba odibo na-agabiga ahụhụ n’ụlọ ebe ha na-agba odibo. ụfọdụ ka a na-apịa oke ụtali, na-akwụ ha agụụ na ntaramahuhụ ndị ọzọ. Otụtụ oge ka a na-awụ ha mmiri ọkụ, ghee ha agụba, mee ha akaje di iche iche, ebe a na-ejikwa aka etigbu ufọdụ ma bochie ha ọnụ. Onye nwụrụ anwụ ọ na-ekwu okwụ?

 N’akụkụ nke ya, ufọdụ ụmụaka na-agba odibo na-eme oke isi ike. N’ụzọ dị otu ahụ ha-anaghi enweta uru ha kwesịrị inweta n’odibo ha gara ịgba. A na-eji n’ihi oke ime isi ike kpọlaa ha. ụfọdụ bụ ndị gaara ịnọ ebe ha gara ịgba odibo ghọọ ogaranya, ma a kpọlara ha n’ihi ime isi ike.

 Ụfọdụ na-emegide ndị ha na-agbara odibo n’ụzọ dị iche iche. Odibo ndị dị otu ahụ na-eti ụmụaka ha na-elekọta ihe ma nne na nna ha pụọ .

Otu nwaanyi kwuru sị na odibo ya kpọtara ka ọ bịa gaara ya ozị ụlọ nọ na-ere ihe nri ya debere n’ụlọ dịka, osikapa, agwa na yabaasị. O kwuru na otu ya siri chopụta bụ na akpa osikapa ya butere gwụrụ na ntụmadị, mgbe o kwesịghị ịgwụ nke mere ka ya kee nkwụcha, leruo anya ala. Otu ahụ ka o siri jide ya otu ụbọchị o zigara ya ahịa, ka ọ na-apụ ka ọ gara chebiri ya n’ama. Odibo ahụ chere na ọ pụrụ apụ wee mekwaa ka o si eme site n’iwerega ihe nri ndị ọ na-ere n’ahia, nwaanyi ahụ were nwụchikọọ ya. Ubọchị ahụ ka ọ gbaara ya ụgbọ nwa mkpi n’ụlọ ya, n’egbughị oge ọbụla.

GUO:  Igba odibo n'oge ugbua

O were bụrụ ya, ihe e mere nke ọma na-adi mma. Otụtụ ndị gbaara mmadụ odibo mechara n’ikpeazụ lee nne na nna ha ukwu nka, site n’ụzọ ahụ kwuchighaa ha ụgwọ ihe ọma ha meere ha. Otụtụ odibo na-emechaa n’ikpeazụ baa ọgaranya karia ndị ha gbaara odibo. Ndi dị otu ahụ na-abia mezie nne na nna ha ukwu, rụọrọ ha ụlọ, gbooro ha ọtụtụ mkpa n’ihi na ha biri nke ọma.

Otu o sila dị, otu nwaanyi aha ya bụ Chinyere Okeke kwuru na ihe ọ sọrọ ya mee na ya agaghị akpọpụkwa nwa ya ọzọ ka ọ ga gbaara mmadụ odịbọ. Nwaanyi ahụ mụtara ụmụ asaa kwuru sị na ọ fọdụrụ obere ihe ka nwa ya nwaanyị nwụọ n’ụlọ onye ọ gara ịgbara odibo. O kwuru na onye ahụ bụ nwanne di ya na onweghi mgbe ya ji tụba anya na ọ ga-emegbu nwa ya, ma dịka o siri kwu, a nyụrụ nwa ya ịkpakwụ site n’iti ya oke ihe na ịkwụ ya agụụ tinyere na ezigaghị ya akwụkwọ.

N’okwu nke ya, otu nwaanyi ajadu sị na nwa ya nwaanị gara ịgba odibọ bu afọ ime were lọta. Mgbe ndị o bi n’ụlọ ha chọputara na ọ dị ime ka ha kpọlatara ya. ọ sịrị na ya jụrụ nwa ya onye tụbara ya ime o kwuo na ọ bụ nna ya ukwu nke mere ka ya jikere kpọrọ nwa ya laghachi azụ ebe ahụ, ma gwa ha ihe nwa ya kwuru.

ọ kọwara na ọ fọrọ obere ihe ka nwoke ahụ kpọọrọ ya na nwa ya ndị uweojii, n’ihi na ya enweghi onye ga-ekwuru ya, na ya kpọrọ nwa ya laghachi azụ.

GUO:  Igba odibo n'oge ugbua

Ugbu a na nwa ya ahụ amụọla nwa nwoke, n’enweghi onye enyemaka obụla site n’ibu afọ ime ruo n’ọmụmụ nwa. N’ihi ọnọdụ ahụ, ajadu nwaanyi ahụ kwuru na ya agaghi akpọpụkwa nwa ya ọzọ odibo, n’ihi na ya amụrụla akọ.

Otu nwoke n’okwu nke ya sịrị na ọ gbara odibo mgbe ya dị n’ụmụaka. Na onye ahụ ya gbaara odibo bụ onyenkuzi, na ọ pịara ya utalị ma ọbụghị na mmegbu, ọ zuru ya ka nwa nke ya n’ihi na onyenkuzi ahụ alubeghi nwaanyị oge ahụ. Na ya nọ n’ụlọ ya gụchaa prịma tupu ya laghachi be nne na nna ya ịga mụọ ọrụaka.

Taa na ya na onyenkuzi ahụ, tinyere ezinaụlọ ya dị na mma, onweghị ihe ya na-eme ha anaghị abịa, na otu ahụ ka ha si abịakwa n’ihe gbasara ya. Ezinaụlọ ya na nke ha na-emezi ka nwanne, ma ha esighikwa otu obodo.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here