Ima ụmụaka nwaanyi elu n’ike: Arụ kacha arụ na-eme ugbua

0
27
Otu nwata nwaanyi amara elu n'ike

IMA ụmụaka nwaanyi elu n’ike bụzi ụkwa a chị n’aka n’oge ugbu a. Ubọchị niile ka a na-anụ akụkọ banyere ya. Gọọmenti na otu dị iche iche tinyere ndị ọnụ ruru n’okwu n’ala anyị akatọọla ya ma kpọọ oku ka a mara ihe e mere ya. Otụtụ akụkọ a nụrụla banyere ya gunyere na a tụrụ otu nwoke nga afọ iri na abụọ maka ịkwa ụmụaka abụọ gbara afọ ise na nke gbara afọ asaa iko n’ike. N’oge gara aga ka a mara nwa afọ isii elụ n’ike ganye n’ọnwụ na Kaduna, tọgbọ ozu ya n’ili ozu ọha na eze. Na Steeti Ondo, otu onye ọrụugbo ji otu nari naịra (N100) rata obere nwa ma maa ya elu n’ike, ọ nwụọ. N’ọtụ aka ahụkwa, otu ọkammụta n’ala anyị ka ndị uweojii kpaara aka maka ịma nwatakịrị elu n’ike.

N’afọ gara aga, bụ 2020 ka United Nations kwuru na a mara ụmụnwaanyi na ụmụaka ọnụogu ha dị puku iri na otu na narị abụọ (11, 200) elu n’ike.

Otụ o sila dị, anyị maara na onụogu ndị ahụ a mara elu karịrị otu e kwuru n’ihi na ọtụtụ ndị mmadụ ewetaghị mkpesa na a mara ha elu n’ike. Ọtụtụ ka e kpere n’ezinaụlọ maọbụ n’obodo ma si otu ahụ mechie okwu nke mere na ndị ọ dị n’aka kwesịrị ima banyere ya anụghị maka ya.

Sọọso ndị a na -anụkarị bụ ndị gbasara ụmụaka site n’afọ ise maọbụ asaa gbadata n’otu ọnwa, maọbụ otu abali (day old), tinyere ndị nke zutere ọnwụ ha na ya. Ọtụtụ ụmụaka na-atụfụ ndụ ha site n’ụzọ dị otu ahụ, ebe ụfọdụ na-ada ọrịa n’ihi na ahụ ha esibeghi ike tinyere na a na-eme ha oke mkpagbu site n’ịdakpo ha ugboro ugboro, n’eleghi anya n’azụ. Udị arụrụala dị otu a bụ ihe gbagwojuru ndị mmadụ anya nke mere na a na-ajụ na-asị: olee otu nwoke isi zuru oke ga-esi hie asaa n’anya maa nwatakịrị ọ mụtara ogbọ ya elu n’ike? Ọtụtụ oge ka a na-anụ n’akụkọ na nna mara nwa ọ mụrụ amụ elu n’ike. Ụfọdụ ụmụnwoke atubala ụmụ ha ime site n’ima ha elu n’ike. Na Steeti Imo, otu nwoke atụọla ụdọ ka e jidere ya ebe ọ na-akwasa nwa ya iko.

Ihe banyere ịma ụmụaka elu n’ike bụzi ihe e ji emezi isiokwu n’akụkọ ụwa n’ụlọ mgbasaozi dị iche iche. A bịa na nzikọrịta ozi onyanwudude, sọ ya ka a na-akọzi maka ya. A nụ otu taa, echi a nụ ọzọ, ebe o siri kacha njọ bụ na onweghị ụmụaka ha hụrụ haa, ma ndị e ku n’aka. E jide ha, ha akpọba ekwensu. Ha asị na ọ bụ akaọrụ ekwensu.

Ufọdụ na-asịkwa na ọ bụ ọnwụnwa nwara ha ka ha hụrụ  ụmụaka nwaanyi ndị ahụ. Olee otu ụmụaka abubeghị nwaanyi, ọtụtụ n’ime ha akpụbeghi ara ga-esi tinye nwoke n’ọnwụnwa? N’ezie, a sị ka ekwube, a ga-asi na ụmụnwoke na-akpa arụ dị otu ahụ bụ ndị nwụrụ anwụ na-aga ije, ndi lara n’iyi, ndị abaghị uru ọbụla n’obodo.

Ọtụtụ oge ka ụmụnwoke ndị ọjọọ na-ejị ihe enweghi isi dịka mmanya ọtọ bịrịbịrị, achicha (biscuit), otu naira maọbụ abụọ wee na-etinye ụmụaka na nsogbụ. N’ihi na ụmụaka enweghi ihe ọbula ha bu n’obi bụ ihe ọjọọ, ha na-eji obi ọcha soro nwoke dị otu ahụ n’enweghi egwu obula. Otụtụ ụmụnwoke ndị ahụ na-abụ ndị ikwu na ibe ha dịka nna, nna nnukwu, nwanne, nwanne nna (uncle) w.d.g.

Ebe ihe si ka njọ bụ na ha machaa ha elu n’ike, ha eyie ha egwu ka ha ghara ịgwa onye ọbụla ihe ha mere, ma gwa ha na ha ga-egbu ha ma ha kwuo ihe banyere ya. Ụmụaka ndị ahụ na-eji ọbi ọcha kwenye n’ihe a gwara ha n’ihi na ndụ aghụghọ adịghị n’ime ha. Ma otu o sila dị, otu ụbọchị kporokpoto ga-agbarịrị n’ihu ehi.

Ka ọ dị ugbu a, ndị mmadụ na-akpọ oku ka a mara ihe e mere banyere ọnọdụ ọjọọ a. E kwesirị ka e nye onye kpara ụdị arụ ahụ ntaramahụhụ siri ike ka ndị ọzọ wee mụrụ akọ. Ihe na-agba anya mmịrị bụ na otụtụ na-akpacha ụdị arụ ahụ lafere n’enweghị ntaramahụhụ ọbụla. Ọtụtụ ndị a kpụpụrụ ụlọ ikpe ka a ga-ekpegide ikpe ọ gaa ọtụtụ afọ nke na ndị mmadụ anaghị amakwa mputara ikpe ahụ. A na-akpọ oku ka e kpee onye ọbụla mara mmadụ, ma nwata ma okenye elu n’ike ikpe ozugbo ma nye ya ntaramahụhụ n’egbughị oge.

ụfọdụ ụmụnwoke ka a na-atụ mkpọrọ ka ọ gachara ọtụtụ afọ ha kpachara arụ ịma nwata elu n’ike. A tụrụ nwoke ahụ mara ụmụaka abụọ elu n’ike nga afọ iri na abụọ ka ọ gachara ọtụtụ afọ ọ kpara arụ ahụ. Nke a pụtara na e kpere ya ikpe ogologo oge.

Ka anyi cheta akụkọ banyere Elizabeth Ochanya Ogbaje, nwa gbara afọ iri na atọ bụ onye nke nwụrụ n’ihi ọrịa a kpọrọ Vesicovaginal Fistula (VVF) na ihe ndị ọzọ o butere n’ihi ịma elu n’ike nke nna na nwa mara ya site mgbe ọ dị afọ iteghete. Ndị mmadụ nọ na-akpọ oku ka e kpee ikpe mkwụmọto maka ya bụ nwata nwaanyi, n’afọ 2018. N’Oge ahụ, akụkọ gbasara ya bụ okwu a kpụ n’ọnụ na nzikorita ozi ọgbara ọhụrụ. Ndi mmadụ katọrọ onyenkuzi mahadum ahụ ya na nwa ya kpara arụ ahụ maka ịma nwata ahụ elu n’ike ọtụtụ afọ wee ganye na ha edulaa ya ala mmụọ. Okwu ahụ pụrụ ụlọịkpe, ma ruo taa ekpechabeghi ya n’ihi na onweghị mpụtara a nụrụ maka ya.Ya mere ndị mmadụ na-ekwu ka ikpe onye mara nwaanyi elu n’ike ghara ịdị na-egbu oge.

Ebe ụfọdụ na-akpọ oku ka e gbụọ onye mara nwata elu n’ike, ụfọdụ na-ekwu ka a tụọ ha nga mkpụrụ oka. Otu o sila dị, o kwesịrị ka e wepu aka enwe n’ofe tupu ọ ghọọ aka mmadụ. Ọ bụrụ na a na-enye ha ntaramahụhụ kwesịrị arụ ha kpara, ndị ọzọ ga-ahụrụ akọ.

Onụdụ ọjọọ a na-eme na ndị mmadụ enweghịzị ntụkwasa obi n’ebe ọtụtụ ụmụnwoke nọ, ma ọ bụrụ  na e lebaa ya anya, nsogbu ga-ebelata nke na agaghi na-anụ banyere akụkọ ọjọọ ahụ oge niile.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here