Ịmụ ejima n’ala Igbo

0
28

EJIMA bụ onyinye si n’aka Chineke. Ihe ọ pụtara bụ nwaanyị ịmụ karịa otu nwa n’otu oge.

  N’oge gboo, ndị Igbo na-ahụta ejima dịka ihe ala na-asọ asọ. N’oge ahụ a na-egbu ụmụejima ma a mụọ ha. Ha mere ihe ndị ahụ n’ihi na ha aghọtaghị. Ha si ụzọ dị otu ahụ gbufuo ọtụtụ ụmụaka bịara ụwa aka ha dị ọcha. Ọtụtụ ụmụnwaanyị ka ha gbabara aka nwa; ebe ọtụtụ nwetara obi mgbawa n’ihi ọnwụ ụmụ ha. N’oge ụfọdụ, ụmụnwaanyị na-agabiga ntaramahụhụ dị egwu ma ha mụchaa ejima.

  Otu o sila dị, n’ihi ọbịbịa ndị ọcha e wetara igbu ejima n’isi njedebe. Ma ka nke ahụ gachara ndị ọgọ mmụọ anabataghị ya nke mere na ha bidoro kpagbube ụmụnwaanyị egbughị ejima ha site n’ịmachi ndị mmadụ imekọnyere ha; ịmachibido ha n’ihe obodo na-eme. Ha bata ebe e nwere ọgbakọ ọtụtụ ndị mmadụ agaghị atụpụrụ ha ọnụ, o kwe ihe ọnụ n’ahịa agaghị eresi ya. Ma n’ime ihe niile, nke ahụ mechara bụrụ akụkọ mgbe ochie.

  N’ụwa taa, ejima bụ ihe oke ọńụ. Ezinaụlọ ọbụla ejima batara be ha na-ekele Chineke n’ebe ọ dị ukwuu ma kpọọ oriri. Ụfọdụ ụmụnwaanyị na-ańụzị ọgwụ ka ha were mụta ejima.

  Ejima juziri eju ugbu a, ọ dibu mbụ ma ọ dịzị ebe niile. Ụfọdụ na-amụcha ejima iteghete, iri.

  Otu nwaanyị aha ya bụ Onyinye Uzo kwuru na ya mụrụ ejima n’ime izizi ya. Ọ kọwara na ya amaghị na ya bu ejima n’afọ na ọ bụ ụbọchị ọ na-amụ nwa n’ụlọọgwụ ka a chọpụtara na ha bụ ejima. Ka ọ mụchara nwa nke mbụ ka nọọsụ tiri mkpu, kpọkuo ndị otu ya kwuo na nwa ọzọ ka nọ n’ime afọ. E mechara, n’egbughị oge ọbụla ọ mụkwuo nwa nke ọzọ.

GUO:  Ịmụ ejima n'ala Igbo

  Ọ gara n’ihu kwuo na ejima ahụ bụụrụ ha ihe ọma. Di ya ji obi ịhụnanya nabata ha. O kwuru na ụmụaka ahụ wetaara ha ngọzị, ịhụ ọma na uju amara. O kwuru na ndị mmadụ na-enwe mmasị inye ụmụejima ahụ onyinye nke mere na ha zụpụtara ha nke ọma.

zụpụtara ha nke ọma.

  Otu nwaanyị mụrụ ejima n’ime izizi ya tụrụ ime ọzọ mụkwa ejima. Ka ọ mụchara ejima nke ugboro abụọ, ọ malitere webe iwe n’ụlọọgwụ. O kwuru na ya tara oke ahụhụ n’ịzụ ụmụejima mbụ ya. O kwara arịrị otu ya ga-esikwa malite ịta ahụhụ dị n’ejima ọzọ.

  N’ezie ọ dịghị mfe ịzụlite ejima maka na ọ na-eri ego na oge. Ka nwaanyị ahụ zụchara ejima ndị nke abụọ ahụ, o mechara mụkwa nwa ọzọ, ma ka ọ tụkwara ime ọzọ, ọ mụkwara ejima ọzọ (nke ugboro atọ). Taa, ụmụ juru be ya, ọńụ juru ezinaụlọ ya obi dịka ọ zụlitechara ha.

  Ejima na-atọ ụtọ. ha na-eyikarị otu ụdị akwa nke na-eme na ị hụ ha ị mata na ha bụ ejima. Ọtụtụ na-eyi onwe ha nke na ịgaghị ama onye bụ onye. Ndị dị otu ahụ na-abụ nwoke nan woke maọbụ nwaanyị na nwaanyị.

  Otu nwaagbọghọ aha ya bụ Ngozi kwuru sị: “Ihe gbasara ejima na-atọ m ụtọ. Aga m achọ ka ime izizi m ga-atụ ma m lụọ di bụrụ ụmụejima. Ha na-agbasi ike ma na-emesikwa ihe ike.”

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here