Ndị ‘Anti-Piracy Society of Nigeria’ anabatala ndị otu ha ọhụrụ

0
29
Ụfọdụ ndi biara mmmemme ahu

NDỊ  ANTI Piracy Society of Nigeria (APSON), ngalaba steeti Anambra anabatala ndị ọhụrụ karịrị otu narị na iri ise n’ọnụọgụ. Ọ bụ n’ụlọ ezumezu Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), Awka, bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa, Sports LightXtra na Homeland ka a nọrọ merube oke mmemme ahụ bụ nke a nọ na ya nye ụfọdụ mmadu onyinye nkwanye ugwu ‘award’.

N’ozi ọ gụpụtara, Onyeisi Zuzugbe (Director General) APSON, Frank Uduonu kelere ọtụtụ ndị e ji okwu ha agba izu gụnyere otu ndị uweojii, ndị na-ahụ maka njem okporoụzọ, otu ndị na-emepụta ihe n’ala anyị (Manufacturer’s Association of Nigeria), ngalaba steeti Anambra maka ịhụ na mbọ ịbuso agha nye  adigboroja bịara na mmezu. Ọ gara n’ihu kọwaa na adịgboroja bụ nke jọgburu onwe ya bụ nnọọ ihe a na-ahụta ebe niile. Ya mere, ọ rụtụrụ aka na site n’ịgbasa ozi ka ndị a  na-ekesara ihe ndị ahụ (consumers) mata banyere ọghọm dị na ha, na ọ ga-amịta ezi mmịmị, dịka a ga-agbasa ozi gazuo ebe niile.

Onyeisioche mmemme ahụ, Fada Martin Anusi nke Fides Media, sokwa rite onyinye ‘award’  kpọkuru ndị ahụ a nabatara ọhụrụ n’otu ahụ ka ha nye Chineke ohere ka o jiri ha kwara ngwa ọrụ. O kwuru na oku a kpọrọ ha bụ nke si na chi ma bụrụ nke ha ga-eji kpochapụ adịgboroja.

Otu n’ime ndị ahụ e nyere onyinye ‘award’, onye hibere ụlọọrụ AliBan de Great Ind. Nig. Limited, Barnabas  Ali toro APSON maka mbọ ha, na inyere ndị na-emepụta ihe aka ichekwa ihe ndị ha na-emepụta, ma si otu ahụ na-ebelata ọghọmahịa.

GUO:  Anambra ejikerela ịchụpụ ndị ọlụ adịgboroja – Adinuba

Ihe pụrụ iche e mere  na mmemme ahụ bụ ịnabata ndị ọhụrụ, inye onyinye ‘award’ na ihibe Tarbt app, bụ ihe a haziri maka iji na-achọpụta adigboroja.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here