Ndị uweojii anwụchikọọla mmadụ ise maka ọnwụ nwaakwụkwọ Dowen Kọleeji

0
27
Oromoni (Jnr) Nke lara mụọ

NdỊ uweojii kọmandị Lagos ekwuputala na  ha anwụchikọọla ụmụakwụkwọ ise aka ha dị n’ọnwụ  Sylvester Oromoni (Jnr) nke Dowen College, Lekki.

Okwuputa okwu ndị uweojii kọmandị Lagos, CSP Adekunle Ajisebutu, onye kwuputara nke ahụ kwukwara sị na a malitela nnyocha banyere ọnọdụ ahụ dịka ọ kọwara na ụmụakwụkwọ ise ahụ na-enyere ha aka n’ime nnyocha.

O kwere nkwa na ndị uweojii kọmandị ahụ ga-eme ihe niile ha kwesịrị ime iji chọpụta otu mmiri siri baa opi ụgbọgụrụ.

Ka ọ dị ugbu a, Kọmishọna  uweojii steeti ahụ, Hakeen Odumosu enyela  Divisional Police Officer, Maroko, ntụziaka ka ọ gaa n’ụlọakwụkwọ ahụ maka nnyocha.

Dịka otu ọnọdụ ahụ si dị oke mkpa, ahafeela okwu n’aka ndị ọ dị n’aka, Homicide Section nke State Criminal Investigation Department, Panti, ozigbo.

Otu o sila dị, otu jikọtara ndị nne na nna n’ụlọakwụkwọ ahụ, akpọọla oku maka ikpenkwụmọtọ n’ebe   Oromoni nọ, tinyere  ịgbanwe ọnọdụ ọchịchị n’ụlọakwụkwọ ahụ.

Ndị nne na nna ahụ gara n’ihu kwuo ka a gbanwee ndị nkuzi na-ahụ maka ebe obibi ụmụakwụkwọ (hostel), tinyere ka e tinye ihe onyoonyoo CCT n’ụlọakwụkwọ ahụ.

GUO:  Ndị uweojii Anambra ejidela ndị otu nzuzo ebe ha na-anabata ndị ọhụrụ

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here