N’Ogun, otu nwaanyi amụnyela enyi di ya ọkụ

0
29

NDI Uweojii Kọmandị Steeti Ogun, anwụchikọọla otu nwaanyi gbara afo iri atọ na abụọ, mụtara ụmụ atọ, Kehinde Abdul Wasiu, maka ịwụ enyi di ya, Tosin Olugbade gbara afọ iri abụọ na atọ mmanụ ụgbọala (petrol), ma mụnyekwa ya ọkụ.

Onye uweojii na-ahụ maka ọdịmma ha na ndị mmadu na steeti ahụ, DSP Abimbola Oyeyemi kwuru na a nwụchikọrọ nwaanyi ahụ kpara arụ site na mkpesa nke di onye nke nwuru anwụ, Fatai Olugbade wetara n’ogige ndi uweojii, Onipanu Divisional Headquarters, Ota. O kwuru si: “Olugbade kpesara na otu oge n’onwa Ọgọstụ, 2021, na o boro nwunye ya Tosin lara mmụọ ebubo na ya na Ismail Wasiu na-enwe mmeko. Tosin kwakọọrọ ngwongwo ya si n’ụlọ ya pụọ laa n’ụlọ Ismail Wasiu, enyi ya nwoke (concubine).

Na Nọvemba 14, 2021, na ya nụrụ na nwunye Wasiu, Kehinde na Tosin nwere nghọtahie nke mere ka Kehinde wụọ Tosin mmanụ ụgbọala, ma mechaa mụnye ya ọkụ. Tosin buru ya gaa ụlọọgwụ ebe a nọ na-enye ya ọgwụgwọ, ma bụrụ ebe ọ nọ wee nwụọ”.

Oyeyemi gara n’ihu kwuo na dịka DPO Onipanu, Bamidele Job nwetachara mkpesa ahu, ya na ndị uweojii ya banyere n’ọrụ ma gaa ebe ya bụ ihe nọrọ me, wee nwụchikọọ Wasiu onye gwarala nwunye ya ka ọ gbalaga. Ma otu o sila dị, o kwuru na e mechara nwụchikọọ nwaanyi ahụ na Saki, Steeti Oyo.

O kwuru na a chọpụtara site na nnyocha na nwaanyi ahụ na di ya tụụrụ ezinaụlọ onye lara mmụọ asi wee kwuo na ọ bụ mmanụ ọkụ ‘gas’ e ji esi nri bigboro ma gbaa ya ọkụ, ma oge eziokwu pụtara ihe, di nwaanyi ahụ gwara nwunye ya ka ọ gbafuo. Nwaanyi kwetere na ya kpara arụ ahụ n’ezie mana na ya amaghị ihe banyere ya isi ụbọchị ahụ.

 Ka ọ dị ugbu a, Kọmishona uweojii Steeti ahụ kwuru na a ga-ewepu okwu ahụ ụlọikpe ma e mechaa nnyocha.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here