Onyeọrụ National Light, Chukwurah agbaala akwụkwọ

0
29
Chukwurah na nwunye ya

AGBAMAKWỤKWỌ bụ ihe oke ọṅụ kemgbe e kere ụwa. Ya mere,  ọ kpọtụrụ akpọtụ ka onyeọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), Awka, ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Kọ Ọ Dị Taa, Sports LightXtra na Homeland, Isaac Okwuchukwu Chukwura kpọrọ ọdị ya n’obi, Callista Chidiebere gaa n’ụlọụka St Thomas Aquinas Catholic Church, Agu Awka, ebe a nọrọ jikọọ ha ọnụ dịka di na nwunye, n’otito nke Chukwu.

Ndị ụkọchukwu si ugwu na ndịda wụchaa ma doo ha asọ, ebe ụwa niile bịara gbaara ha akaebe ma soro ha ṅụrịa.

N’okwuchukwu, Fada Dennis Nwabueze gwara ha mkpa ọ dị ịnọ Chineke nso oge niile. O kwuru sị: “Ekpere ga-ejikọ ezinaụlọ unu ọnụ. Unu bụzi otu ugbu a, hụnụ onwe ụnụ n’anya. Ma ọdị mma, ma ọ dị njọ, bụrụnụ otu.”

N’okwu nke ya, onyeisioche mmemme ahụ ma bụrụkwa onyeisi (MD) ANPC, Sir Chuka Nnabuife kelere Chineke maka onyinye nke ndụ ma kpọkuo  di na nwunye ọhụrụ ahụ ka ha jiri ịhụnanya wee na-ebi dịka ọ gwakwara ha ka ha nọgidesie ike n’ekpere.

N’akụkụ nke ya, nwaada gbara akwụkwọ bụ Callista kwuru sị:” Obi bụ m sọ aṅụrị maka na taa mụ na onye m hụrụ n’anya abụrụla di na nwunye..”

Ọ na-abụ e kwuo na ihe na atọ ụtọ, e kwuo ihe ọ na-atọ ka ya; n’ihi ya, nwoke gbara akwụkwọ bụ Okwuchukwu kwuru sị: ” Ọṅụ juru m obi. Ihe niile m chọrọ na nwaanyị zuru oke n’ebe nwunye m nọ.”

O kelere Chineke ma kelekwaa ndị bịara soro ha ṅụrịa.

Ihe pụrụ iche e mere na mmemme ahụ gụnyere ịwa achịcha bekee, egwu na ikpori ndụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here