Akụkọ iho: Akajiaku na nwunye ya

0
24

O NWERE otu nwoke aha ya ụ Akajiaku, ọ bụ onye obodo a na-akpọ Enudike. Akajiaku bara ọgaranya na-esi isi. Ọ bụ onye na-azụ ahịa nke ude ya na-ede na mba niile. N’ihi azụmahịa, ọ gazuola mba niile gbara ala ya gburugburu.

  Ihe akụ akụ na ihe enwe enwe jupuatara n’ụlọ ya. Ehi, ewu, atụrụ, ọkụkọ, ji na ede, tinyere ihe ụlọ ndị ọzọ bụ atụrụ taba.

  Akajikau na ezinaụlọ ya na-ebi nke ọma. Nwunye ya bụ Uloaku mụtaara ya ọtụtụ ụmụ. A gbakọba ihe ụwa, Akajiaku so n’onye a ga-asị n’ụwa zuuru ya, n’ihi na onweghị ihe kọrọ ya.

  N’agbanyeghị ngọzị niile Akajiaku nwere, otu ihe na-echu ya ụra abalị ma na-ewute ya oge niile. Ihe ahụ bụ na nwunye ya bụ Uloaku jọrọ njọ nke ukwuu. Ọ dị ka ikwighikwighi. Njọ ahụ Uloaku jọrọ ekweghị Akajiaku ńụrụ mmiri tọgbọ iko, oge niile ka ọ na-eche ihe ọ ga-eme banyere ya.

  Ya mere, o ruru otu ụbọchị, Akajiaku wee bekuo chi okike ma rịọ ya ka o mee ka Uloaku nwunye ya maa mma. Chi okike zara ya ekpere nke mere na nwunye ya gbanwere n’otu ntabianya, maa mma dị egwu. Nke a tụrụ Akajiaku n’anya nke mere na ọ kpọrọ ndị obodo oriri n’ụlọ ya n’ihi na ọ bụ onye na-eme ọgọ mgbe niile. Ndị mmadụ malitere kpọbazie nwunye ya Apunanwụ n’ihi na mma ọ mara na-awụ akpataoyi; ọ dị ka akụ mmiri igwe.

  Ozigbo Akajiaku kpọchara oriri, ndị agha eze na-achị obodo ahụ wụchara n’ụlọ Akajiaku wee gwa ya na eze nyere iwu ka ha kpọtara ya nwunye ya ka ọ bụrụzie nwunye eze n’ihi na ọ bụ sọ eze kwesịrị ịlụ nwaanyị mara ụdị mma ahụ. N’obodo ahụ, eze kwuo o kwuchaala, anaghị agbagha ya okwu n’ihi na onye mere nke ahụ, e gbue ya.

GUO:  Akụkọ ifo: Nwata ghọrọ eke

  Otu a ka ndị agha eze siri kpọrọ nwunye Akajiaku gaba be eze. Ka ha pụchara, Akajikau kwara arịrị, ọ rịọrọ Chi okike ka o mere ya ebere site n’ime ka nwunye ya dịkwa ka ọ dị na mbụ. Chi okike nụrụ olu ya wee mere ya ebere, ozigbo ahụ nwunye ya gbanwere wee dịkwa ka ọ dị na mbụ. Ọnọdụ ahụ gbagwojuru ndị agha eze anya ma otu o sila dị, ha kpọọrọ Uloaku kpọgara eze. Ka eze hụrụ ya, o ji olu ike baara ha mba ma nyekwa ha iwu ka ha kpọchighaa ya azụ na be di ya.

  Mgbe ha kpọrọ ya lọta, Akajiaku ji ọńụ nabata nwunye ya, bie ya ọma ma susukwaa ya ọnụ. Site n’ụbọchị ahụ gawa, ọnaghị ewutekwa ya na nwunye ya jọrọ njọ. O ji obi ọma na afọ ojuju nabata ya dịka nwunye ya n’ihi na o kwuru sị: “Kama rijuo afọ dachie ụzọ, ka m buru ọnụ (kwụrụ agụụ).”

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here