Anambra etoola Bishọp Okeke ka ọ na-ala ezumike

0
17
Bishọp Okeke

STEETI Anambra etoola Bishọp ụka Katọlik Dayọsis Nnewi, ‘Most Rev. Dr.’ Hilary Paul Odili Okeke, onye lara ezumike dịka bishọp dayọsis ahụ na ngwụcha izuụka, ka ọ gbara afọ iri asaa na ise, nke bu afọ iwu ụka kwuru.

  Kọmishọna na-ahụ maka mgbasaozi na ịkụziri ọha na eze ihe ha kwesịrị ịma, C. Don Adinuba kwuru n’ozi ya n’Awka, isi steeti ahụ sị: “Ọrụ Bishọp Okeke dịka onye ndu nke Dayọsis Nnewi kemgbe afọ iri abụọ na otu abụghị ihe ọzọ karịa nke juputara na mkpali mmụọ na ihe ilegara anya. Aka Chukwu Mụọnsọ ga-adịrịrị na nhọpụta a họpụtara ya ka bishọp mbụ nke dayọsis ahụ e kepụtara ọhụrụ, n’ihi na o bugoro dayọsis ahụ n’ogo dị elu na ngakaba ọbụla, n’obere oge.”

 Kọmishọna Adinuba toro Bishọp Okeke ma kwuo na ọbụghị sọọsọ na ọ kpara ike n’ilekọta ụka a hanyere ya n’aka, kama na ọ gara n’ihu rụọ ụlọọgwụ, ụlọahụike bụga ịgba ma tinyekwara ime onwe ya mmụọọma nke udo na ọganihu.

 O toro bishọp ahụ maka umeala na ịgba mbọ ịrụ ọrụ niile e nyere ya kemgbe e chiri ya ụkọchukwu ka ọnwa Epure dị n’abalị iri abụọ, n’afọ 1974, n’agbanyeghị ahụhụ dị iche iche na-adịgasị na ya.

 Kọmishọna Adinuba rụtụrụ aka na  oteghị aka e chichara ya ụkọchukwu site n’aka Cardinal Francis Arinze, onye bụ Achịbishọp Onitsha oge ahụ, na e zigara ya otu obodo dị n’okpuru ọchịchị Ogbaru ka ọ rụọ ọrụ dịka ụkọchukwu na onyenkuzi ụlọakwụkwọ kọleeji, oge obodo ahụ enweghị ihe ndị e ji enyere ndụ aka dịka: ezigbo mmiri ọṅụṅụ, okporoụzọ e tere korota na ọkụ. Ma n’ime ihe niile ọ kpara ike dị egwu ma kpalite mmụọ ndị mmadụ, na kọleeji ọhụrụ ahụ tinyere parish ya.

 Kọmishọna ahụ kwuru na ọ bụ ụdịdị boshọp ahụ, tinyere ụbụrụ ịnụ ọkụ o nwere mere o jiri bụrụ onye klaasị ya mbụ bụ Mọsaịnọ (papal chamberlain), ‘vica general’, na bishọp.

 Adinuba kọwara Bishọp Okeke ka ọkaiwu ụka (canon lawyer) na ode akwụkwọ a maara nke ọma na mba ụwa, ma kwuo na ọ bụ ihe ọṅụ n’ihi na onye na-anọchi anya ya bụ Bishọp Jonas Benson Okoye, (Auxiliary Bishọp Dayọsis Awka), bụkwa onye ụbụrụ ya na-aghọkwa nkọ ka agụba ma marakwa ihe ekwe na-akụ.

 N’okwu nke ya, aka na-achị steeti Anambra, Gọvanọ Willie Obiano kwuru sị na Dayọsis Nnewi nwere chi ọma dịka a họpụtara Bishọp Okoye, onye  nke a marala nke ọma na steeti Anambra ka ezi onye ọzụzụ atụrụ, ka ọ bụrụ bishọp ọhụrụ ha.

 Gọvanọ Obiano kwuru sị: “Ọ na-elebara ma mkpuruobi ma ọdịmma ndị mmadụ anya, nke mere o ji bụrụ onye ndu ndụ mmụọ, zuru oke ma kwesịkwa ntụkwasa obi.”

 N’akụkụ nke ya,Gọvanọ a họpụtara ọhụrụ (gọvernor elect), na steeti Anambra, Ọkammụta Charles Chukwuma Solido, ekelekwaala Bishọp Okeke n’ihe nke ọ kpọrọ; ezi ndu nke dayọsis Nnewi ihe karịrị afọ iri abụọ.  O kwuru sị: “Ọ bụ ọka ibe n’ihe banyere ndụ mmụọ, ọchịchị, nchọcha na edemede.”

  Ọkammụta Soludo gara n’ihu kwuo na ndị otu ya na ụmụakwụkwọ ya ka na-ekwurịrị maka ọrụ ya oge ọ bụ onyeisi na ngalaba iheọmụmụ Canon Law na Catholic Instute of West Africa (CIWA), Port Harcourt, steeti Rivers nke dị n’okpuru University of Calabar.”

 Otu o sila dị, Ọkammụta Soludo kwuru na a tụrụ anya na Bishọp Okoye ga-eme karịa onye ọ na-anọchi anya ya n’usoro mmụọ ọhụrụ e nwere na steeti Anambra.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here