Bayelsa anwụkọọla ehi 44 tara ahịhịa ebe ekwesịghị

0
19

GỌỌMENTI steeti Bayelsa ebuola agha megide ịda iwu na-echekwa otu ehi si akpagharị na-ata ahịhịa na steeti ahụ nke a kpọrọ Anti-Open Grazing Law.

  N’ihi ọnọdụ ahụ, a nwụchikọọla ehi dị iri anọ na anọ n’ọnụọgụ bụ ndị a hụrụ ka ha na-ata ahịhịa n’ogologo ụzọ Imiringi  dị n’okpuru ọchịchị Ogbia na steeti ahụ.

  Gọvanọ Douye Diri nọ na Maachị 10, 2021 binye aka ma mee ka ọ bụrụ iwu ‘Anti-open Grazing Law’ nke a maara ka Livestock Breeding, Rearing and Marketing Regulation Law.

  Ọ kwụbakwara kọmiti na-ahụ banyere ya nke kọmishọna na-ahụ maka ọrụugbo, Maazị David Alagoa nọ n’isi ya, tinyere ndị ọzọ a họpụtara site ọrụ nchekwa dị iche iche.

  Otu o sila dị, ọtụtụ ndị ọrụugbo n’Imiringa, Elebele na Emeyal dịcha n’ọkpuru ọchịchị Ogbia tinyere Tombia na Okutukutu dị n’okpuru ọchịchị Yenagoa eteela ha ji enye mkpesa banyere otu ehi si emebicha ihe ha kọrọ n’ugbo n’agbanyeghị iwu ahụ e hibere.

  Ndị ọrụugbo ahụ enyela mkpesa n’Alagoa, tinyere ndị ọrụ gbanụgbanụ (task force) steeti ahụ, ka ha nye aka kwụsị ọnọdụ ahụ tupu ihe emebie.

  Ya mere, Alagoa anwụchịkọọla ehi ndị ọ hụrụ ka ọ na-eme mkpagharị ebe ndị na-achịkwa ha tinyere isi n’ime ọhịa ka a hapụ ịnwụchịkọ ha.

  E mere nnwụchịkọ ahụ site na mkpesa ndị ọrụugbo nyere n’ogologo ụzọ Imiringi n’akụkụ ‘Megastar Camp’, ebe ha mere ka ndị ọrụ gbanụgbanụ mata mkpamkpa ehi na-akpa n’ugbo ha.

  Alagoa kwuru na ndị ọrụ gbanụgbanụ ga-aga n’ihu na-arụ ọrụ ha iji gosipụta na gọọmenti steeti ahụ agaghị anabata mmadụ ịda iwu o tiri.

GUO:  Na Bayelsa, mmadụ ise anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ

  Otu o sila dị, otu n’ime ndị ọrụugbo ahụ, Maazị Tempo kọwara na ehi mebichara ugbo ya dị n’Elebele, ebe ọ kọrọ ọka na akpụ.

  Ya mere, ọ kpọkuru gọọmenti steeti ahụ ka ha na-aga n’ihu n’ọrụ ahụ n’ihi na ndị na-achị ehi na-eyi onye ọrụugbo ọbụla gwara ha banyere imebi ugbo ha egwu ibuso ya agha.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here