Echiche ndị mmadụ banyere 2022 ka ọnwa Jenụwarị na-abịa na njedebe

0
20

ONYEKA Odidika – Otu ihe siri gbata kwụrụ, ahụtala m ngọzị n’ime afọ a n’ihi na m ka dị ndụ ruo ugbu a. Onye dị ndụ nwere olile anya. Ya mere enwere m okwukwe na ihe ga-adị mma.

  Ma otu o sila dị, ihe kacha echere ala anyị aka mgba bụ ọnọdụ enweghị ezi nchekwa. Nke a emebiela ihe n’ebe ọ dị ukwuu. Iji ma atụ, na ngalaba ọrụugbo, ihe anaghị agazi dịka o kwesịrị. Ndị na-achị ehi ekwezighị na ndị ọrụugbo ga-ekuru mmiri togbọ iko. Ha na-achị ehi baa n’ugbo ndị mmadụ mebichaa ihe a kọrọ n’ugbo. Ọtụtụ ndị ọrụugbo ka ha gburu egbu ma merụọ ndị ọzọ ahụ site n’igbujipu ha aka, ịghụpụ ha anya, tinyere ụzọ ndị ọzọ dị iche iche. Ha amaala ọtụtụ ụmụnwaanyị elu n’ike, ma ụmụaka ma okenye. N’ihi ọnọdụ ahụ, ndị ọrụugbo anaghị enwezi ike ịkọpụta ihe ga-ezu ọha obodo. Nke a mere na e nwere oke ihe isi ike n’ala anyị. Agụụ na-anyụ ndị mmadụ ịkpakwụ.

  N’ihi ajọ ọnọdụ a, ọtụtụ ndị ntọrọbịa etinyela aka ha na ntọrị na mpụ dị iche iche.

  Biko ana m akpọku gọọmenti ka ha mara ihe e mere ajọ ọnọdụ a tupu mmiri ańaa gari. Ha mara ntaramahụhụ ga-eso ajọ omume nille ma gbaa ndị ọrụugbo ume site n’inye ha ezi nchekwa. Ọ bụrụ na ha mee otu ahụ, ọnọdụ ga-agbanwe, ihe ga-adịrị onye elu na onye ala mma.

  Ya mere, afọ 2022 ga-adị mma. Enwere m okwukwe na a ga-enwe ezi mgbanwe nke ga-eweta ọnọdụ ga-aka mma.

Chidimma Nkwo – Oo oo ya! Ihe adịgo mma n’afọ a bụ 2022. Adị m ndụ ma nwee ezi ahụike. Onye ọbụla dị ndụ ga-ahụ ihe ọma. Ana m agbara onwe m mbọ site n’ime na ịrụ ọrụ m kwesịrị ịrụ ka ezinaụlọ m wee na-eri nri iji wee dị ndụ. Ihe ga-adị mma ma onye ọbụla tinye uchu na-agba mbọ ghara ịnọ nkịtị na-eche onye ọzọ ka o nyere ya aka. A na m enye ndụmọdụ ka ndị mmadụ teta n’ụra baara onwe ha uru. Ka anyị hapụ ịdị na-eche gọọmenti ka ọ na-eme ihe niile. Ọtụtụ ndịntorobịa gụchara akwụkwọ nọ nkịtị, onweghị ihe ha na-eme, ịjụọ ha, ha azaa gị na ha na-eche ọrụ gọọmenti, tupu ị mara ihe na-emenu, ha etinye akana  mpụ na arụrụala. Ha achọghị ịmụ ọrụ nke ha na-achọ ịzụ ahịa. Afọ a bụ 2022 ga-adị mma ma anyị niile tinye aka n’ọrụ ma dị uchu. Ọ ga-ebelata arụrụala dị iche iche a na-arụ n’ala anyị.

  Ịnọ nkịtị so n’ihe na-ebute nsogbu n’obodo. Ya mere, afọ a ga-abụ afọ ọma n’ebe ndị kwere ekwe nọ. Onye ọbụla na-agba mbọ ga-ahụ ihe ọma. Ihe ọzọ dị n’ime ya bụ ka anyị na-enwe ańụrị oge niile. Ọ bụ onye na-enwe ańụrị ga-eleru onwe ya anya nke ọma wee mara ihe o kwesịrị ime.

Rose Okeke – Ọ bụ eziokwu na ihe siri ike mana enwere m olile anya na ihe ga-aka mma n’afọ a bụ 2022. Ana m akpọku ndị mmadụ ka ha chọọ ihu Chukwu n’ihi na ọ bụ so na ya ka ihe ga-esi wee dị mma. Ọtụtụ ndị mmadụ hapụrụ ụzọ nke Chineke ma gbasoro ekwensu, nke mere na katakata na-ada ebe niile. Ịghafu ọbara karịrị akarị n’elu ụwa n’oge a. A na-egbuzi mmadụ ka e si egbu anụmanụ. Oke ọchịchọ juru ebe niile. Ihe ọjọọ ndị ọzọ dịka akwamiko, ohi, asị na arụrụala ndị ọzọ na-arị ibe ya elu. Ihe ndị a wee jide ala anyị ghasaa. Kedụ otu obodo ga-esi dị mma mgbe ha nọgidere n’ime ihe ọjọọ? Ọ gaghị ekwe omume.

  Ya mere ana m arịọ ya ka ọ bụrụ arịọrị, ka anyị niile gbasoro ụzọ nke Chineke ka ihe wee dị mma. Onye ọbụla malite mebe nke a ozugbo, ihe ga-agbanwe, ihe niile ga-adị mma. N’oge ahụ, egwu agaghị adịkwa ebe ihe niile ga na-aga sịrịrị werere.

  Otu o sila dị, ekwere m kwesie ike na afọ a ga-aka nke gara aga mma. Ọ bụrụ na onye ọbụla gaa adụ nyara n’olu, ala anyị ga-abụ ala a gọzịrị agọzị.

Oriakụ Nnanna – Otu m siri hụta afọ a, ihe isike ka na-agakwa n’ihu. Agụụ na ihe ụkọ dị iche iche cheere ndị mmadụ aka mgba. Ị baa n’ime ahịa, ịgaghị egotenwu ihe oriri ma ya fọzikwa ihe ndị ọzọ.

  Ma otu o sila dị, olile anya dị, afọ a ka malitere amalite. Igbo kwuru sị na ejighị ụtụtụ ama njọ ahịa. Ọ bụrụ na ndị mmadụ hapụ oke ọchịchọ, ihe ga-adị mma. Oke ọchịchọ so n’ihe mebiri ụwa. Onye ọbụla na-achọ ihe okwu, onwekwaghị onye kwere na ọ ga-abụ obere. N’ime ihe niile ekwere m na afọ 2022 ga-adị mma.

Ijeoma Amechi – Ka ihe siri gbata kwụrụ ugbu a, amachaghị m ka ọnọdụ ga-adị, ma otu ihe m maara bụ na ọbụrụ na e nwee ezi nkwado na ileba anya site n’aka gọọmenti na ndị mmadụ, ihe ga-adị mma n’afọ a.

  N’aka gọọmenti, o kwesịrị inwe ebumnuche maka afọ 2022 ma kwado ihe ọ ga-eme nke ọma. Nke ahụ ga-eme ka ihe dịrị ndị ọ na-achị mma. Gọọmenti kwesịrị ileru anya nke ọma hazie ihe dịka o kwesịrị, sọ ya ga-eme na ihe ga-adị mma.

  Ọzọ dịka ibe ya bụ na ndị mmadụ ga-ahazi onwe ha ma mee ihe ha kwesịrị ime. Ha agaghị eche gọọmenti ka ọ na-eme ihe niile. Ọ bụghị gọọmenti ga-ahaziri gị ndụ gị gwa gị ihe ikwesịrị ime ka i were dị ndụ. Mmadụ kwesịrị inwe ihe o bu n’uche banyere ndụ ya. Mgbe onye ọbụla leruru anya na ndụ ya site n’ime ihe o kwesịrị ime, ọnọdọ ga-agbanwe. Ya mere, ana m eche na afọ a bụ 2022 ga-adị mma ma anyị sụọ akwụ n’ikwe, ghara ịsụ n’ala.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here