Egwu ndị Igbo: Egwu ụmụaka

0
20

 EGWU ụmụaka bụ egwu sọọsọ ụmụaka na-agba n’ala Igbo. Ụmụaka na-agba egwu n’oge dị iche iche. Mgbe ụfọdụ ha na-amalite n’egwu ọnwa na-amụ ma na-agba egwu tupu ha ebuputa ya. Mgbe ụfọdụ ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị na-agba egwu iche iche ma na-agbakọta ọnụ mgbe ụfọdụ.  

  Ha na-anọkwazị n’ụlọ mmadụ amụ egwu. Ha mụtachaa, ha ebuputa ya ka ọha obodo hụrụ.

  Ụmụaka na-ebuputakarị egwu n’emume iri ji ọhụrụ site n’ịgba ya ebe obodo na-eme emume iri ji. Mgbe ọzọ ha ji ebuputakwa egwu bụ n’emume ekeresimesi. N’ebe ụfọdụ ha na-ebu ya aga n’ụlọ n’ụlọ si ụzọ dị otu ahụ na-adata ego. Egwu na-ewete ịdịnotu na ezi mmekọrịta n’etiti ụmụaka ma na-akwalitekwa omenala.

GUO:  Egwu ndị Igbo: Egwu nwa

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here