Na Makurdi, ọkụ agbagbuola nwa ọnwa atọ na-arahụn’ụra n’ime ụlọ

0
22

Ọ BỤ ihe oke mwute n’ebe ndị bi n’okporoụzọ Awe dị na Makurdi, steeti Benue nọ, ka ọkụ gbara ụlọ obibi ndị mmadụ gbagburu  obere nwata nwaanyị dị ọnwa atọ.

  Otu onye agbataobi aha ya bụ Hassana Ayuba kwuru na ọ bụ mgbe o ji ihe dịka ọkara gafee elekere iri nke ụtụtụ ubọchị ahụ ka otu nwata chọpụtara na anwụrụọkụ na-asụpụta n’otu ụlọ dị n’ebe ahụ. Nwata ahụ kpọtụụrụ otu nwanyị bi ebe ahụ ozugbo, bụ onye tụgharịrị hụ anwụrụọkụ ahụ ma tikuo ndị mmadụ.

  Ọ kọwara na mgbe ndị agbataobi ji gbata ọsọ enyemaka, na ọ karịala n’ihi na ọkụ ejezuola ọnụụlọ asatọ dị n’ụlọ ahụ.

 Ayuba kwuru na dịka ndị agbataobi na-agba mbọ ụzọ ha  ga-esi kwapụta ụfọdụ ngwongwo ndị mmadụ bi n’ụlọ ahụ, nke ha enweghị ike menwuo; na onweghị onye  chetara na obere nwa ahụ a ka na-eku eku dina n’ime otu ọnụụlọ arahụ ụra.

  O kwuru sị, “Nne nwata ahụ hafere ya n’aka otu onye bi n’ụlọ ahụ, were gaba akwụkwọ. Obere nwata nwaanyị kwọbu ya n’azụ nibere ya n’ihe ndina ya dị n’ime ụlọ mgbe ụra buuru ya n’azụ ya. Ya mere, nwata ahụ na-arahụ ụra n’ime ụlọ mgbe ọkụ ahụ malitere mana onyeghị onye chetere ya n’ihi ọkụ ahụ bịara na mberede. Mgbe otu onye jiri cheta ya, oge agaala maka na ọkụ agbaala nwata ahụ gafee nke ịmatakwa ya. Ọdịkwaghị mma ile anya. Ọ dị oke mwute.”

  Ọdachi ahụ tinyere nne nwata ahụ, Amira Abdul, gbara afọ iri na isii n’ọnọdụ ihe mgbu. Ọ kọwara na nwata ahụ lara mmụọ bụ nwa ya nke abụọ, na nke nwoke tọrọ ya dị afọ abụọ.

GUO:  Ọkụ agbagbuola ụmụaka atọ n'Obosi

  O kwuru sị:”Ụbọchị ahụ, ka m wụchara nwa m ahụ ma kwadochaa ya, ndị agbataobi m nọ na-agwa ya na ọ maka, m kelee ha. Ọ gachaghị otu awa m hafechara ya n’aka onye agbataobi m wee pụọ, otu onye bịara n’ụlọakwụkwọ anyị gwa anyị na ọkụ gbara be anyị. Ka m nụrụ nke ahụ, echere m na ọbụ obere ihe wee ruo mgbe nwaanyị ọzọ bịara gwa m ka m laa n’ụlọ. Mgbe m jiri laru ụlọ wee hụ ka ọkụ ọgbụgba ahụ si mebie ihe, amalitere m bewe akwa, jụọ maka nwa m. Ọ bụ oge ahụ ka ha gwara m na ọkụ gbagburu nwa m”

 Otu o sila dị, otu onye agbataobi, Alhaji Shuaibu Bello toro ndị ntorobịa ogbe ahụ ndị gbara oke mbọ wee kwụsị ọkụ ọgbụgba ahụ ma gbochie ya ịgafe n’ụlọ ndị ọzọ dị n’ogbe ahụ. Mgbe akụkọ jiri ru anyị aka, ọ kọwara na a matabeghị ihe kpatara ọkụ ọgbụgba ahụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here