Na Taraba, ndị agha ọ lụọ ọ laa atụnyela ihe mbigbọ n’ụlọụka Katọlik

0
24

IHE mbigbọ (explosive device) nke e chere na ọ bụ ndị agha ọ lụọ ọ laa (terrorists) tinyere ebigbọla n’ụlọekpere (Catholic Chapel) nke St John College, Mutum-Biyu, isiobodo okpuru ọchịchị Gassol na steeti Taraba.

  Onyeisi ụlọakwụkwọ ahụ, Fada Emmanuel Ikyaan gwara ndị ntaakụkọ na ihe mbịgbọ ahụ bigbọrọ n’ihe dịka mgbe o ji nkeji iri abụọ gafee elekere asaa nke uhuruchi ụbọchị ụka.

  O kwuru sị: “Anyị na-ekele Chineke na o nweghị ndụ a tụfuru, ma e mebiela ụlọụka ahụ. Ka ọ gachara nkeji iri ihe ahụ bigbọchara, anyị bidoro nụba ụda egbe n’obodo. Ndị ntorobịa na ụfọdụ ụmụakwụkwọ nọ na-eme emume n’ụlọekpere ahụ bụ nke e jikwara mere ụlọezumezu ụlọakwụkwọ, ma ha apụọla ebe ahụ mgbe adịghị anya tupu o bigbọọ.

  Ana m akpọ oku ka e mee ezi nnyocha iji chọpụta ndị aka ha dị na ya bụ ihe merenụ ma mee ha ihe e kwesịrị ime dịka iwu kwuru.”

  Onye uweojii na-ahụ maka mmekọ ha na ọhaneze na steeti ahụ, Abdullahi Usman, kwuru na ya bụ ihe mere eme n’ezie.

  O kwuru sị: “Ihe merenụ bụ na ụfọdụ ndị ntọrị bịara ịtọrị otu onye nwere ọdụ mmanụ ụgbọala n’obodo ahụ, ma ha enweghị ike imenwu ihe ha chọrọ ime. Ka ha na-agba ọsọ ka a ghara ijide ha, ka ha malitere gbaba egbe aghara aghara. Ya mere, ha tụnyere ihe mbigbọ n’ụlọụka ahụ iji yie ndị mmadụ egwu, ka ha were nwee ike ịgbalaga. Ihe mbigbọ ahụ bigbọrọ, ma mebie ọtụtụ ihe n’ụlọ ahụ ma onweghị ndụ a tufuru.”

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here