Nri ndị Igbo: Ofe nsala

0
22

NRI ndị Igbo na-atọ ụtọ ma na-edozi ahụ. Ọ bụ ya mere na ịhụ onye Igbo ọbụla o ju eju. Otu ndị Igbo si akwado ihe oriri ha na-adị iche, ndị Igbo na-akwọ aka nke ọma ma na-ehikwa aka n’anya n’ịkwado ihe ha ga-eri.

  Na nri nke izu a, anyị ga-esi ofe nsala. Ofe nsala na-atọ ụtọ pụrụ iche. Ofe nsala nwere ihe ndị e jị esi ya na-eme ya ka ọ dị iche. O nwere ndị mpaghara ala Igbo ọ bụ naanị ofe nsala na-amasịkarị ha.

  Ihe ndị a ka e ji ofe nsala nakwa otu e si akwado ya. Anụ ewu, anụ ehi, anụ nchi, azụ ndụ maọbụ azụ nkpọ, ịra, okporoko, kanda, mkpụrụ ụziza, okpeyi. I sikọchaa anụ ọbụla ị chọrọ i ji sie ya wụpụ ya debe. Ọ bụrụ azụ ndụ ka ị chọrọ iji sie ya, ị ga-asa ya nke ọma sikọọ ya debe.

  Gbanye mmiri ị ga-eji sie ofe, ọ gbọọ wụnye okporoko, o ghee, wunyezie ịra, mkpụrụ ụziza I suru nke ọma, ose, okpenyi magị, nnu, bachaa ji ị ga-e ji rọọ ofe tinye, ji ghee sụọ ya ka ọ nọọ anọọ ka o wee ghara ịgbari n’ime ite. Ọ bụrụ azụ mkpọ ka ị chọrọ i ji sie ya wụnye ya mgbe ị wụnyere ndị ọzọ, o ghee wụnye anụ ahụ ị sikọrọ maọbụ azụ ndụ i sikọrọ ya na akwụkwọ ụziza, kwuchie ya ọ gaa nkeji ise fọtuo ya.

  Nri olulo e ji eri ofe nsala o wee baa nke ọma bụ ndị a: nri ji a sụrụ nke ọma, nri akpụ, nri e sere nke ọma, nri ede a sụrụ nke ọma nakwa gari. 

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here