Obiano etoola ndị Anambra maka ịza òkù ‘Akụ Ruo Ụlọ’

0
19
Gọvanọ Obianọ (onye nke atọ n'aka nri) oge ọ gachara na-apụ̀tazị n'ụlọahịa 'Stanel World' dị n'Akwa, ya na ụfọdụ ndị soro ya wee gaa njem nleta ebe ahụ

Ọ NA-ABỤ akụ ruo ụlọ, a mara onye kpara ya.

  N’ihi nke a, aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ etoola ndị Anambra zara oku ‘Akụ Ruo Ụlọ’ ahụ ọchịchị ya na-akpọ wee welataruo akụnụba ha ụlọ, site n’ịbịa rụọ ụlọọrụ, ụlọahịa, ụlọ mmepụta ngwahịa, na ihe mwunye ndị ọzọ dị icheiche n’ime steeti ahụ.

  Gọvanọ Obianọ kwupụtàrà nke a oge ya na ụfọdụ ndị e ji okwu ha agba izu n’ime steei ahụ gara njem nleta n’ụfọdụ ebe dị icheiche a rụrụ ụlọahịa na ụlọ mmepụta ngwaahịa ọhụrụ n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ, nke gụnyere ụlọahịa ‘Everyday Supermarket’, ‘Stanel World’ na ‘Radopin Supermarket’.

  Njem nleta ahụ bụ nke a nọrọ na ya wee duru Gọvanọ Obianọ na ndị ya na ya so wee gagharịa na gburugburu na ime ụlọahịa ahụ, ka o wee jiri anya ya hụ ka ọnọdụ siri gbata kwụrụ n’ebe ahụ.

  N’okwu ya oge ọ gagharịchara n’ebe ndị ahụ ma zụrụkwa ụfọdụ ihe, ya bụ Gọvanọ kwupụtàrà afọojuju ya nà ọñụ o nwere na steeti ahụ nọ n’ezi ọnọdụ mmepe dị elu ugbua karịa ka ọ dị oge ọ batara n’ọkwa ọchịchị.

  O kelekwara ndị nwegasị ụlọahịa na ụlọọrụ ahụ maka ịza oku ‘Akụ Ruo Ụlọ’ ahụ, ma kwekwa ha nkwàdo na gọọmenti ga-aga n’ihu inye ha na ụlọọrụ ha ezi ọnọdụ dị larịị maka azụmahịa ha, ọkachasị dịka o siri metụta ezi ọnọdụ nchekwa na ụlọọrụ na ezi ọnọdụ ndị ọzọ ga-enye aka ime ka azụmahịa na arụmọrụ ha na-agawanye n’ihu n’enweghị ihe mkpọbịụkwụ ọbụla.

  Ka ọ na-ekwe nkwà na ọchịchị na-abàta ọhụrụ na steeti ahụ ga-amalitekwa ebe ya onwe ya kwụsịrị ma gakwa n’ihu n’inye ha nkwàdo zuru òkè; Gọvanọ Obianọ kpọkukwazịrị ndị Anambra ndị ọzọ bigasị ebe dị icheiche n’ala Nigeria nà ná mba ofesi ka ha sokwa na ndị zara òkù ahụ site n’iwèlata akụnụba ha ụlọ, maka na nke ahụ ga-enyekwa aka n’ịkwalitekwu ọnọdụ mmepe steeti ahụ n’ogoogo kacha elu, tinyere ọtụtụ úrù ndị ọzọ nke ahụ ga-ewèta.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here