Ụgbọala egbuola mmadụ abụọ n’Anambra, gbalaga

0
19
Ebe ahụ ihe mberede okporoụzọ ahụ mere

OZI si n’aka ụlọọrụ na-ahụ maka njem awele okporoụzọ n’ala Nigeria, bụ ‘Federal Road Safety Corps (FRSC)’, ngalaba steeti Anambra na-akọwa na mmadụ abụọ anwụọla, ebe mmadụ iri na anọ ndị ọzọ nwetara mmerụahụ n’ihe mberede okporoụzọ dapụtara na steeti ahụ na nsonso a.

  Onye jigodi ọkwa ugbua dịka onye na-ahụ maka ịkụziri ọhaneze ihe ha kwesiri ịma n’ụlọọrụ FRSC n’ime steeti ahụ, bụ DRC Margaret B. Onabe bụ ya mere ka ụwa mara nke a site n’ozi ọ kụpụ̀ụ̀rụ̀ ndị ntaakụkọ na nsonso a n’Awka bụ isi obodo steeti ahụ.

  Dịka o siri kọwaa, ya bụ ihe mberede okporoụzọ dapụtàrà na mpaghara ‘Asaba Park’ dị n’Upper Iweka, n’ogologo okporoụzọ awara-awara ahụ siri Awka gaa Onitsha.

  O kwuru na ihe mberede ahụ metụtàrà ụgbọala ise, nke gụnyere ụgbọala ‘Daf Truck’ (nwere ákàrà XC 416 PK), ụgbọala ‘Daf Truck’ ọzọ (nwere ákàrà DTF 249 XA), ụgbọala ‘Toyota Hiace Bus’ (nwere ákàrà FGG 929 ZD); ụgbọala ‘Toyota Hiace Bus’ ọzọ (nwere ákàrà XB 994 GBK); na ụgbọala ‘Lincolin Jeep’ (nwere ákàrà RSH 450 BM).

  O kwukwàrà nà ndị ọnọmgbeomere kọwàrà na ihe mberede ahụ mèrè n’oge ehihie, ma bụrụkwa nke dapụtàrà n’ihi ngharị̀pụ ihe nkwụsị ụgbọala, bụ ‘brake’ n’asụsụ Bekee.

  Ọ kọwàrà na ụgbọala gwongworo ahụ (nwéré ákàrà XC 416 PK) pụ̀nàhị̀rị̀ n’aka onye na-anya ya, wee jiri ọsọ sukara ụgbọala ndị ọzọ dịgasị n’ihu ya, jirikwa ọsọ dakpuo n’ọ̀wà mmiri dị nso n’ebe ahụ. Ngwangwa nke ahụ mere, onye na-anyà ụgbọala ahụ mapụ̀tàrà ozigbo, rie mbọmbọ ọsọ.

  Ọ sị na mmadụ iri abụọ na abụọ (nke gụnyere ụmụnwoke iri na atọ, ụmụnwaanyị asaa, na ụmụaka abụọ) nọ n’ime ụgbọala ise ahụ oge ahụ ya bụ ihe mberede okporoụzọ mere.

GUO:  Mmadụ abụọ anwụọla n'ihe mberede okporoụzọ n'Anambra

  O kwukwàrà na ụmụnwoke abụọ nwụrụ ozigbo ahụ ihe ahụ mèrè, ebe mmadụ iri na anọ (nke gụnyere ụmụnwoke asaa na ụmụnwaanyị asaa) nwetere mmerụahụ, ma bụrụkwa ndị e bùùrù gaa ụlọ ahụike ‘Toronto Hospital Borromeo’ dị n’Onitsha ahụ, bụkwa ebe dọkịta nọ n’ọrụ nọ̀rọ̀ wee gbaa akaebe na mmadụ abụọ ndị ọzọ ahụ anwụọla.

  Ọ kwùrù na a donyezị̀kwàrà ozu mmadụ abụọ ahụ n’ụlọ nchekwa ozu dị n’ụlọọgwụ ahụ.

  N’okwu nke ya, onyeisi ụlọọrụ FRSC na steeti Anambra, bụ CC Adeoye Irelewuyi dụrụ ndị na-anya ụgbọala maọbụ ihe ọbụla a na-anya ànyaà n’okporoụzọ ọdụ, ka ha na-eleru ya anya nke ọma ma gbakwa mbọ hụ na ọ kwụ n’egwú tupu ha eburu ya pụta n’okporoụzọ, maka adịghị ama ama.

  Ọ kasiri ezinụlọ ezinụlọ ndị nke ha nwụrụ n’ihe mbere okporoụzọ ahụ obi, kpee ka mkpụrụobi ha zuo ike na ndokwa, ma kpekwazie ka ndị nke nwetara mmerụahụ gbakere ma nweta ọgwụgwọ n’oge adịghị anya.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here