A tụọla otu nwoke nga mkpụrụọka maka ịtụba nwa ya nwaanyị ime

0
22

ỤLỌIKPE, Ikeja Domestic Violence and Sexual Offences Court atụọla otu nwoke gbara afọ iri anọ na abụọ aha ya bụ Ekpo Lawrence nga mkpụrụọka,maka ịma nwa ya nwaanyị gbara afọ iri na ise elu n’ike ugboro ugboro, ma tụbakwa ya ime.

  Ka ọ na-ebe ikpe, Ọkaikpe Justice Abiola Soladoye kọwara na ikpe mara ya bụ nwoke. O kwuru na arụ nwoke ahụ kpara dị oke njọ ma bụrụ nke adịghị mgbaghara dịka o siri dị na ‘Section 137 of the Criminal Law of Lagos State 2015’ ma bụrụkwa ihe nkatọ n’ụzọ ọbụla.

  Ọkaikpe ahụ kwuru na omume ọjọọ o mere site n’ịdịna nwa ya nwaanyị ruru ịnyị, bụrụ ihe ihere dị egwu ma bụrụkwa arụ nke na-adabaghị otu o kwesịrị n’ebe obibi ndị mmadụ dị. Ọ katọrọ ya kpamkpam dịka o kwuru na ọ kpụrụ onwe ya na-ala ma jụọ ajụjụ sị: “Olee ebe ugwu nwoke a nwere dịka mmadụ dị?”

  Otu o sila dị, Soladoye kpere ekpere ka nwata ahụ nna ya metọrọ nwee udo nke ime obi, nke ga-ewepụrụ ya egwu na akpọmasị n’ebe nna ya nọ, bụ onye kwasoro ya iko n’ike ọtụtụ oge; ka o nwee ike gabiga ihe mgbu, ọnwụnwa na mkpagbu niile ahụ, wee nwee ike bie ndụ bara uru.

  O kwuru sị: “Nna bụ onye kwesịrị ka nwa ya nwee ntụkwasa obi n’ebe ọ nọ. Ọ bụ onye kwesịrị ịchekwaba ndụ nwa ya, ma o megidere ya, ree ya kọbọ na afụ site n’ịkwasa ya iko. O wepụrụ ịdịọcha (purity) n’ahụ ya ma na mkpuruobi. Nke a bụ nsọala, nke bụ na ọ ga-agbarịrị egwu kwesịrị na ọ ga-agba maka arụ ọ kpara. N’ihi ihe ndị a a gụpụtara, a na-atụ ya nga mkpụrụọka nke enweghị ohere ịkpa nha (fine). Ọ ga-edebanye aha ya na regista ndị dara iwu akwamiko (Sex Offenders Register), dịka gọọmenti steeti Lagos sị debe ya.’

  Dịka ndị Ọkaiwu kpere ya ikpe (prosecution) nke Bola Akinsete nọ n’isi ya siri kwu, Lawerence kpara arụ ahụ n’agbata Disemba 2018 na Juunu 2019, n’ụlọ ya dị n’Agege, Lagos. Ọ dị afọ iri atọ na iteghete mgbe ọ kpara arụ ahụ. O kwuru sị: “O metọrọ nwa ya nwaanyi gbara afọ iri na ise site n’ikwasa ya iko, nke iwu akwadoghị”

Oge a na-ekpe ikpe ahụ, mmadụ anọ gbaara ndị ahụ aka ebe, ndị gụnyere nwata ahụ e metọrọ, dibịa oyibo/dokịnta, onye ọrụ odịmma ọha na eze (social worker) na onye uweojii, ebe sọọsọ Lawrence gbaara onwe ya akaebe. Nwata nwaanyi ahụ, onye di afọ iri na asaa oge o kwuru ọnụ ya n’ụlọikpe kwuru na nna ya emetọọla ya ugboro ugboro, oge ọbụla nne ya (stepmother) mere njem. O kwuru na ọnọdụ ọjọọ ahụ putara ihe oge ya mere ka otu onye ọrụ ọdị mma ọha na eze nọ n’ụlọakwụkwọ ha mata banyere otu nna ya si akwasa ya iko.

 N’okwu nke ya, Dọkịnta Maria Fadaka nke Mirabel Centre (Sexual Assault Referral Centre), kọwara na ka o mechara nwata nwaanyi ahụ nnyocha, na ọ chọpụtara na ihe o jiri bụrụ nwaanyi adikwaghi otu ọ kwesịrị ịdi nke gosịrị na ihe agaala na ya, tinyekwara afọ ime nke ọ ka na adita ọhụrụ, oge ahụ.

Otu o sila dị, Lawrence gọrọ agụgọ na ya akwasaghi nwa ya iko, dịka ọ kọwara na ya nọ n’ọrụ ya oge akụkọ banyere mmetọ ahụ malitere.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here