FGN/IFAD VCDP agbapeela ahịa ọhụrụ n’Azia

0
22
Obiọma Mbanefo (nke atọ n'aka nri) na ndị ọzọ mgbe ọ na-agbape ahịa ahụ

ÒTÙ ‘International Fund for Agricultural Development Value Chain Development Programme’ (a maara n’aha mkpìrìsì dịka IFAD VCDP) nọrọ na nsonso a wee gbapee agadaga ahịa abụọ gburu ego ruru nde naịra iri abụọ na ise a rụrụ n’obodo Azịa dị n’okpuruọchịchị ime obodo Ihiala nke steeti Anambra.

  Ya bụ agadaga ahịa abụọ a rụrụ n’ahịa Obom Azịa nwèrè ụlọahịa ruru iri na anọ n’ime ya, ma nwekwa ebe a na-aga mposi.

  N’okwu ya oge ọ na-agbape ahịa ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ ugbo na steeti Anambra, bụ Maazị Nnamdi Onukwuba, nke onye nọchitere anya ya bụ onye enyemaka pụrụ iche nye Gọvanọ Willie Obianọ n’ihe gbasaara ọrụ ugbo, bụ Maazị Obioma Mbanefo gwara ndị obodo ahụ ka ha lekọta ihe ahụ anya nke ọma. Ọ gwakwara ndị ritere uru n’amụmà FGN/IFAD VCDP ka ha jiri ya bàárá onwe ha uru ma kwàlitekwa ọnọdụ akụnụba ha.

  Na ntụnye nke ya, onyeisi nlekọta FGN/IFAD VCDP n’ime steeti Anambra, bụ Maazị Nnamdi Agwuncha kwere nkwà na ha ga-aga n’ihu inye ndị ahụ nkwàdo, ọkachasị site n’ịrụrụ ha ogige ebe a na-esucha akpụ, bụkwa nke imezupụta ya gà-ádàbere n’etu ha siri lekọta ahịa ahụ.

  N’akụkụ nke ha, onyeisioche nchere oge n’okpuruọchịchị ime obodo Ihiala, bụ Maazị Jude Obi, na onyeisi ọchịchị obodo Azia, bụ Dọkịta Toonna Nwabueze kèlèkwazịrị Gọvanọ Obianọ maka mbọ dị icheiche ọchịchị ya gbagoro n’ịkwàlite ọrụ ugbo na steeti ahụ. O kwezịrị nkwà na a ga-echekwaba ya bụ ahịa na ihe ndị ọzọ a rụụrụ ha.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here