N’Awka, MOD emeela emume icheta ụbọchị ha

0
17
Fada Oranye na Sir Ezeuchu ( n'etiti), ụfọdụ ndị MOD, ndị nnukwu nna ha, tinyere ndị ọzọ mgbe a nọ na mmemme ahụ

IGBO kwuru okwu si na mmiri anaghị amachi nzọ ụkwụ onye ezi omume, ma kwukwaa na ọ bụ ka onye si eme ka atańụ sị akpọ ya. Nke a wee bụrụ ụka, bụrụ ilu. Ya mere, ọ kpọtụrụ akpọtụ ụbọchị ụka n’ụlọụka St Thomas Aquinas Parish, G.R.A Awka, dịka ndị òtù Man of Order and Discipline (M.O.D), Zoonu Awka mere emume icheta ụbọchị ụkọchukwu hibere òtù ahụ, Msgr O.P Achebe. Ndị MOD gbara zuzugbe wee bịa maka ikele Chineke n’isi ụkọchukwu ahụ lagoro mmụọ.

  Ụkọchukwu parish, St Thomas Aquinas, Fada Francis Oranye toro Msgr Achebe maka ezi mbọ na ụkpụrụ ọma ọ tọrọ n’ụwa site n’ihibe òtù M.O.D. O kelekwara ndị òtù ahụ maka ọrụ ha ma kpọkukwaa ha ka ha jisi ike rụrụ ya na-aga n’ihu.

  N’okwu nke ya, osote onyeisiocche mbụ (Ist vice chairman) nke ụlọụka ahụ, Sir J. Ezeuchu kwuru sị: “Ana m esonyere ụkọchukwu parish na-asị ụnụ nnọọ n’Aquinas. Aha a bụ M.O.D nyere afọ ojuju zuru oke. O gosipụtara na ụnụ na-eme ka a na-enwe ezi nchekwa na ịgbasoro iwu, ya mere anyị nabatara ọbịbịa ụnụ bịara ma na-aja ụnụ ike ime nke ọma na-aga n’ihu. Anyị na-asị ụnụ nnọọ.”

  Nna (chief patron) nke MOD, zoonu Awka, Major Udekigbo Emeka kọwara na oke emume ahụ bụ ome n’afọ nke ha na-eme iji mee ka ndị mmadụ mata banyere òtù ahụ.

  O kwuru sị: “Anyị nọ na parish Aquinas taa iji nye ndị MOD nkwado, tinyere ime ka ndị na-abịa ụka na parish a mata na òtù a dị mkpa. Otu jikọtara ndị Bishọp n’ala anyị, Catholic Bishop’s Conference of Nigeria (CBCN) na-enye anyị nkwado, nke mere na Bishọp dayọsis ọbụla bụ nnukwu nna (grand patron) anyị. Ya mere, M.O.D dayọsis Awka na-eme nke ọma n’ihi ezi nkwado nke Bishọp Ezeokafor na-enye anyị.”

 Udekigbo gara n’ihu kọwaa ọrụ òtù ahụ na-arụ n’ụka dịka o kwuru sị: “Anyị na-azụ ndị ntorobịa ka ha gbasie ike, kee nkwụcha maka ezi nchekwa. Ọrụ anyị bụ ịhụ na a na-agbaso ezi usoro iwu na nchekwa, ọ kachasi na Sakaramenti dị Ngọzị, ọ bụ nke a mere na njirimara (symbol) anyị bụ achịcha na mmanya (host and bread).”

  Ọ kpọkukwara ụkọchukwu parish Aquinas maka ezi nkwado.

  Onyeisioche M.O.D zoonu Awka, Lt Ubaka Sunday kwuru sị: “Taa anyị na-echeta ma na-ańụrị maka onye hibere òtù a bụ M.O.D, Msgr O.P Achebe. Jenụwarị 25 bụ ụbọchị ọ danyere kpọmkwem mana anyị na-ebuga ya n’ụka izizi na-esote ya, afọ ọbụla. AnyI bịara ebe a taa mee ya iji me ka ndị mmadụ nọ na parish a mata banyere anyị dịka MOD Aquinas na-akwado ime emume nhibe (inauguration).”

  N’okwu ha dị iche iche, otu onye nna (patron) M.O.D, kaptin, inginia A.J Okoye na osote onyeisioche MOD zoonu Awka, Lt. Okoye Chijioke (JP) gosipụtara ọńụ ha nwere banyere emume ahụ ma kelekwaa Chineke, onye mere ka ọ daa ụda.

  Otu onye M.O.D Achịdayọsis Onitsha, Obiasogu Henry kwuru sị: “Anọ m ebe a taa n’ihi mmemme a, nke anyị ji echeta Msgr Achebe onye nwụrụ ka ọnwa Jenụwarị dị na mkpụrụ ụbọchị iri abụọ na ise, n’afọ 1997. M.O.D eguzorola n’ozuzuoke. Ọ bụ otu na-azụlite ndị ntorobịa ka ha na-atụ egwu Chineke site n’ichekwa ụka, ọ kachasị Sakaramenti dị Ngọzị. Ya mere, anọ m ebe a isonyere ndị Awka wee ńụrịa n’ihi na M.O.D bụ otu ebe nille.”

  Ọchịọra nwaanyị (Chairlady) nke MOD zoonu Awka, Oriakụ Uchenna Okeke kwuru sị: “Ana m ekele Chineke onye mere ka ihe niile gaa nke ọma. Ọ bụ emume ome n’afọ nke anyị na-eme iji cheta nna anyị, Msgr Achebe. Obi bụ anyị sọ ańụrị n’ihi na MOD tinyekwara otu afọ taa.”

  Ka ọ na-egosipụta afọ ojuju o nwere banyere otu emume ahụ siri gaa karịa ka a tụrụ anya, onyeisioche M.O.D parish Aquinas bụ Patrick Chukwuemeka Okafor kọwara na ọ bụ n’obi Chukwu St Patrick’s Cathedral Awka ka ha na-anọbu eme oke emume ahụ ma n’ihi ọnwụ ụkọchukwu parish ahụ, na e butere ya na St Thomas Aquinas. Ha bịara ka ha mee ka a mata banyere MOD dịka a na-akwado emume ihibe ya (inauguration) na parish ahụ.

  Ya mere, o kelere ndị niile bịara oke mmemme ahụ ma gọkwaara ha ọfọ ọma sị: “Ana m asI ụnụ niile nnọọ, ụnụ mere nke ọma wee bịa, ekpere m n’isi ụnụ bụ ka ụnụ laa ebe ụnụ siri bịa n’udo, n’enweghị nsogbu ọbụla.”

  Ụfọdụ ndị nna (patron) MOD n’ụlọụka Aquinas, ndị gụnyere Ọkammụta Chukwudi Nwizugbo, Oriakụ Patricia Mbamalu nọnyere ha, ma jakwaa ha ike ka ha rụrụ ọrụ ọma na-aga.

  Ihe pụrụ iche e mere na mmemme ahụ bụ pareedị na ụfọdụ njirimara ndị MOD.

  Ka anyị cheta na Msgr Achebe hibere MOD n’afọ 1983. Ọ nwụrụ na Jenụwarị 25, 1997.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here