SEYAN ahọpụtala Ijegalu dịka okwuputa okwu ha

0
21
Okwuputa okwu SEYAN, Ijegalu na ndị ọzọ ahọpụtara

NDỊ ntorobịa obi na-anụ ọkụ, nọ n’otu a kpọrọ The South East Youth Assembly of Nigeria (SEYAN) emeela nhọpụta ndị ọchịchị ha, nke mbụ n’ala anyị (national executives) ka ha na-ahụ banyere otu ahụ, ọ kachasị ndị igbo.

 Nhọpụta ahụ, nke a nọ n’ụlọ ezumezu Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), Awka, bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa, SportsLighTXTRA na Homeland gara nke ọma. Ndị mmadụ nọchitere anya steeti ise dị n’ala Igbo bịara ma were otu olu kwekọrịta n’ihe ha mere.

  N’okwu ya ozugbo a họpụtachara ya, onye jibu ọkwa dịka   Onyeisi National Association of University Students (NAUS), bụzi Okwuputa okwu SEYAN, Simon Felix Ijegalu, na-anọchite anya Eziagu/Udi ‘Federal Constituency’ steeti Enugu, kwuru sị na ọdị mma na ọchịchọ ndị South/East dị mkpa. O gosipụtara afọ ojuju ya banyere otu e siri họpụta ya ka ọ bụrụ onye ndu otu ahụ. O kwere nkwa iji ike ya niile rụọ ọrụ.

  O kwuru sị: “Oge eruola mgbe anyị ga-eme ka ndị be anyị, ma ndị nọ n’ụlọ ma ndị nọ na mba ụwa dị iche iche sonye na mbọ a na-agba iji wee nwete ihe anyị chọrọ na South/East. Anyị ga-eme ike anyị, otu a bụ iji nweta ihe ruuru South/East.”

 N’okwu ha gwara ndị ntaakụkọ, ‘Majority Leader’ Julius Nnamdi, ‘Deputy Minority Leader’ Abaegbu Nnamdị, Onyendu ụmụnwaanyị (Female Leader), Chinturu  Ikonne C. Dollar, kwere nkwa ime dịka a tụrụ anya.

  Ha kpọkuru Gọọmenti Etiti ka ha lebaa anya na mkpa ndị ntorobịa, site n’ịkwado ha, nye ha ọrụ ma mee ka e hibega ụlọọrụ nke onwe. Ha kwuru na ọ dị mkpa ime ka ndị ntorobịa mata ihe ha kwesịrị ịma ma kwukwaa na e leghaara South/East anya dịka ha rụtụrụ aka na  ndị Igbo dị njikere ịchị ala anyị n’afọ 2023. Ha kpọkukwara ndị ntorobịa ka ha bagide ndọrọndọrọ ọchịchị bụ nke ga-enyere ha aka inweta ihe ha chọrọ.

GUO:  NAUS, ngalaba Anambra ehibela ndị ọchịchị ọhụrụ

  Ndị ọzọ a họpụtara gụnyere: Osote okwuputa okwu: Oyeh Johnkingsely Chukwuebuka – Onye na-anọchite anya Orumba North/South ‘Federal Constituency’, steeti Anambra; ‘Majority Leader’- Ndive Julius Nnamdi nọchitere Anambra East/West ‘Federal Constituency’, steeti Anambra; Osote ‘Majority Leader’ – Nicholas Odozor si Igbo Etiti/Uzo-Uwani ‘Federal Constituency’ steeti Enugu; ‘Chief Whip’ – David Uzoma Andrew si Oguta Ohaji Egbema na Oru West ‘Federal Constituency’, steeti Imo, Osote ‘Chief Whip’- Nwambe Richard si Ezza South/Ikwo ‘ Federal Constituency’, steeti Ebonyi; ‘Minority Leader’ – Agbam Sunday si Ezza North/ Ishiellu ‘Federal Constituency’ steeti Ebonyi; Osote ‘Minority Leader’ – Abaegbu Nnamdi si Bende, steeti Abia; Onyedu ụmụnwaanyị, Chinturu Ikonne C. Dollar si Obingwa Ugwunagbo/Osisioma ‘Federal Constituency’ steeti Abia.  

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here