Udu na ihe ndị e ji ya eme

0
23

 UDU bara nnukwu uru na ndụ ndị mmadụ. Ma n’ala Igbo ma n’ala anyị niile gbaa gburugburu, e ji udu egbo mkpa dị iche iche.

  N’oge gboo, ọ bụ udu ka e ji echu mmiri. Onye ọbụla, ma nwoke, nwaanyị, ikoro, agbọghọ na ụmụaka na-eji udu echu mmiri. Otu ọghọm dị na ya bụ na onye ọbụla ji udu chu mmiri, ọ daa ada maọbụ udu ahụ dachapụ n’isi ya, ọ kụwaa. Onye ụdịrị ọnọdụ a dapụtara ebe o churu mmiri na-agba aka mmiri alọta. N’ihi ya, onye ọbụla ji udu chu mmiri na-ehi asaa n’anya ka ọ ghara ịkụwa udu.

  Udu na-adị n’ụdị dị iche iche. Ụfọdụ na-epe mpe ebe ụfọdụ na-ebu ibu zaa otooto afọ. Udu ndị buru nnukwu ibu ka e ji echekwa mmiri n’ụlọ. Ejighị ụdị ahụ echu mmiri. Ihe a na-eme bụ a na-echute mmiri a na-agbanye ya n’ime ndị ahụ. Ọbụladị mgbe mmiri na-ezo, a na-ejikwa udu echete mmiri.

  E wepu iji udu echu mmiri, e jikwa ya abanye ihe na mmiri. Ọmụmatụ bụ ihe dịka ịbanye akpụ ka o ruo. Ọ bụ n’udu ka a na-abanye akpụ n’oge gboo, o ruo, a yọọ ya.

  E jikwa udu echekwa ihe dị iche iche, dịka ihe ndị e wetere n’ugbo. Ihe ndị ahụ e ji udu echekwa gụnyere ọka, egwusi, abacha, akịdị, ose, ọpapa/ahụekere w.d.g. Tupu e tinye ha n’ime udu, a ga-ebu ụzọ gbaa ha n’anwụ ma hụ na ha kpọrọ akpọ nke ọma. E tinyechaa ha n’ime udu, e kpuchie ha nke ọma. N’ụzọ dị otu ahụ, oke na ụmụ anụ ndị ọzọ agaghị ata ha.

  E wepụ iji udu eme ihe n’ụlọ, e jikwa ya akụ egwu. Ya mere, udu so n’otu akọrọngwa e ji akụ egwu. A na-akụ ya ọ na-ada ‘dum dum dum’. A na-akụ ya na akọrọngwa ndị ọzọ, ọ na-atọpusi ụbụrụ isi.

  Ọtụtụ ndị ọkwa nka ji ịkpụ udu wee mere akaọrụ n’oge ahụ, ma jiri ya mepụta ọtụtụ ihe, site otu ahụ baara onwe ha na ezinaụlọ ha uru.

  Ma n’ụwa taa, udu adịghịkwa ka ọ dị na mbụ. Ọtụtụ ndị mmadụ ejizighị ya eme ihe n’ezinaụlọ ha. N’ihi nke a, udu dizi ụkọ n’ahịa n’ihi na ndị mmadụ agbasorola ụzọ ahụrụ dị iche iche e ji ebi ndụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here