A kpụpụla ajadu ụlọikpe maka iji agụba bekasịa nwa oje ozi ya gụrụ anụ n’ite ofe

0
17
Nwaanyị ahụ na oje ozi ya

NDỊ uweojii anwụchịkọọla otu nwaanyị ajadu, Oriakụ Opeyemi Omoyemi maka ịńyụ nwata nwoke oje ozi ya gbara afọ iri na abụọ ịkpakwụ, site n’imerụ ya ahụ n’ụzọ dị oke egwu. Ọ bụ n’Akure, isi obodo steeti Ondo, ka ya bụ nwaanyị mụtara ụmụ anọ nọ wee yie nwa oje ozi ahụ, Joel Sunday, egwu.

  E kwuru na o ji osisi na agụba (razor blade) wee merụọ ya ahụ n’ebe dị iche iche n’ahụ ya, dịka o kwuru sị na ọ gụụrụ anụ na nri ụbọchị ụka.

  Ya mere, a kpụpụrụ Omoyemi ụlọikpe majie dị na isi obodo steeti Ondo, n’ime ụzọ ihe ise gụnyere ịgbụ ọchụ, mmegbu ụmụaka, ibuso agha megide mmadụ, w.d.g.

  Onye uweojii okwu dị n’aka, Emmanuel Tanimowo kwuru na ọ kpara arụ ahụ na Febụwarị 6, 2022, n’ụlọ ya n’Idimango dị na mpaghara Adewale, okporoụzọ Ondo, Akure.

  Tanimowo gwara ụlọikpe ahụ na ọ bụ otu nwaanyị onye ọrụ ahụike ọha na eze aha ya bụ Alice Ayedun wetara mkpesa ahụ dịka ọ hụchara nwata ahụ ka ọ nọ n’ihe mgbu, ebe ọbara na-agba ya site n’akụkụ ahụ ya dị iche iche.

  O kwuru sị: “Oriakụ Ayedun Alice na-aga ụka oge ọ hụrụ otu onye aha ya bụ Sunday Joel ka ọ na-ebe akwa ma bụrụkwa ọbara ahụ ya nke mere ka nwaanyị ahụ kwụsị wee chọpụta ihe na-emenụ. Dịka ọ hụrụ nwaanyị ahụ ka ọ na-eti nwata nwoke ahụ ihe n’azụ ụlọ, ọ zọpụtara nwata ahụ ozigbo gwa nwa ahụ ka ọ sachapụ ọbara n’ahụ ya ka o jichara agụba karịkọọ ya ahụ ma mee ka ọnya gherecha oghe n’ahụ ya. Iji zọpụta nwata nwoke ahụ site n’aka nwaanyị ahụ, Ayedun gwara ya na ya bụ nọọsụ, na ya na-akpọga nwa ahụ ụlọọgwụ ka ọ nara ọgwụgwọ.”

  Otu o sila dị, ọ kọwara na nwaanyị ahụ mechara kpọga nwata ahụ n’ogige uweojii, Fanibi Police Station iji nye mkpesa, nke mere ka a nwụchikọọ nwaanyị ahụ kpara arụ.

  Ka a nọ n’ogige ndị uweojii, nwaanyị ahụ kwetere na ya kpara arụ ahụ ka ya chọpụtara na nwa ahụ agụrụla anụ niile dị n’ite ofe ya. Ọ kọwara na nwa ahụ chọrọ ịgbapụ ọsọ ozugbo ọ hụrụ ya, ma ya jidere ya, ma mechaa kpọrọ ya baa n’ụlọ nnọkọ ha (sitting room), ebe ya nọ jiri agụba karichaa akụkụ ahụ ya dị iche iche.

  Ka ọ dị ugbu a, a kpọgara nwata nwoke ahụ n’ụlọ ahụike ndị uweojii ebe ọ na-anara ọgwụgwọ mana ọ ka nọ n’ọnọdụ ọjọọ.

  Omoyemi kwetere na ya dara iwu n’ikpe atọ a na-ama ya ma na ya adaghị atọ ndị ọzọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here