Aka NDLEA akparala DPO ndị uweojii, ndị ọzọ maka ịtụ mgbere ọgwụike

0
17

ỤLỌỌRỤ National Drug Law Enforcement Agency (NDLEA) anwụchikọọla otu nwoke aha ya bụ Monday George, jibu ọkwa dịka ‘Divisional Police Station (DPO)’ nke Idanre ‘Police station’, steeti Ondo, maka ịtụ mgbere ọgwụike.

  Okwuputa okwu NDLEA, Femi Babafemi, n’okwu ya n’Abuja, kwuru na a chụrụ ya bụ nwoke n’ọrụ n’ihi ịdaga iwu n’ihe gbasara ọgwụike.

  O kwuru na a nwụchikọrọ ya na onye otu ya, Emmanuel Eniola, gbara afọ iri anọ ka ha ji ọgwụike ‘280 blocks of compressed cannabis weighing 168kg’.

  O kwuru sị: “A nwụchikọro ha ụbọchị ụka ọnwa Jenụwarị dị n’abalị iri atọ na Mokwa, steeti Niger, ka e jidere ụgbọala Toyota Avalon ha nke akara ya bụ EKY 429 BZ (Lagos) ka ọ bụ ihe ndị ahụ n’Idanre, ma na-aga Kanji, mpaghara Borgu dị na steeti ahụ.

  N’akụkụ ọzọ, Babafemi kwukwara na ndị ọrụ (Narcotic officers) n’ọdụ ụgbọelu Murtala Muhammed International Airport (MMIA), Ikeja, Lagos, kụsara mbọ ụfọdụ ndị na-atụ mgbere ọgwụike chọrọ ibufe ‘methamphetamine Brazil na UK, nke e jidere ha ugboro ugboro.

  Babafemi gara n’ihu kwuo na NDLEA nwụchikọrọ otu nwoke, Iliyasi Yushau si Kampala Uganda ‘via’ Nairobi, Kenya ka o ji kaadị (debit cards) dị narị abụọ, iri isii na asatọ (268) n’ọnụọgụ, n’ọdụ ụgbọelu ahụ.

  Ọ kọwara na kaadị ndị ahụ nke bụ nke ndị ụlọ ọbaego Access Bank, GT Bank na Zenith Bank bụ ndị a ka kpachịkọrọ (seized) oge ha na-eme nnyocha ndị njem nọ n’abalị iri atọ.

  O kwukwara sị: “Na steeti Edo, ndị ọrụ nọ na Fraịdee, Febụwarị 4, wee wụchaa ọhịa ‘Igbogiri forest’ dị n’okpuru ọchịchị Orhionwon ma mebie ugbo anọ ebe a kọrọ ọgwụike (dry season cannabis) nke dị hekta ala 3.067718. Nke a dapụtara ka ọ gachara otu ụbọchị enwetachara akpa ‘compressed blocks of cannibas’ dara 269.5kg, bụ ndị nke e chekwara n’ime ọhịa n’Uzebba dị n’okpuru ọchịchị Owan West.”

GUO:  Isi ụlọọrụ ndị uweojii a kpụgharịa ndị omekome kariri iri atọ

  Ọ gakwara n’ihu gbaa ama na ndị ọrụ ha, kọmandị Kaduna nwụchịkọkwara Buhari Umar, ka o bu ọgwụike ‘300 shisha pens and 999 portions of synthetic cannabinoids’ nke dara 9.690kg.

  Otu o sila dị, Babafemi kwuputara ọtụtụ steeti ndị ọzọ ndị ọrụ NDLEA nwụchikọrọ ndị na-atụ mgbere ọgwụ ike; ma kwuo na onyeisioche NDLEA, Brig. Gen. Buba Marwa toro ndị ọrọ ahụ tinyere ndị ọrụ ọdụ ụgbọelu Lagos, Niger, Edo, Borno, Plateau, Kwara, FCT, tinyere ndị kọmandị Delta, maka ike ha kpara.

  Babafemi kwuru na ụdị ọrụ ọma ha ruru mere na akpachikọrọ ọgwụike dị puku kwuru puku n’ọnụọgụ n’ala anyị n’ime izuụka gara aga, ma kpọkuo ndị ọrụ ahụ na ndị otu ha nọ na kọmandị ndị ọzọ dị iche iche ka ha dị ike n’ọrụ ha, ka anya saa.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here