Ichekwa mmiri ọńụńụ: Udu na akpati njuoyi, kedụ nke ka mma?

0
16
Udu na akpati njuoyi

MMIRI ọńụńụ dị nnukwu mkpa na ndụ mmadụ. Ya mere ichekwa ya nke ọma dịkwazị mkpa ka o were nye ihe a chọrọ.

  N’oge gboo, udu ka e ji echekwa mmiri ọńụńụ. Ọ na-eme ka mmiri jụọ oyi dịka o kwesịrị. Mmiri ọbụla e si n’ime udu kupute na-adị jụụ n’ahụ. Onye ńụchaa ya, o nwee ọńụ na afọ ojuju na ọ ńụrụ mmiri n’ihi na ọ na-adị ka chi siri ke ya.

  Ma n’oge ugbu a, a nọzi n’ụwa ọhụrụ, ihe agbanweela; ndị mmadụ agbasorola ụzọ ọhụrụ. Ihe e ji echekwazi mmiri ọńụńụ bụ akpati nyụoyi/friiji (refrigerator).

  Nke a na-echekwakwu mmiri n’ụzọ nke ya. Ọ na-ajụ mmiri oyi karịa udu. Otu o sila dị, ihe nwere uru nwere ọghọm tinyere na onye ọbụla bụ mmadụ nwere ihe ọ chọrọ. N’ihi ya, ọtụtụ mmadụ tinyere ọnụ n’okwu a were kwuputa echiche ha.

Ugochukwu Ezeh – Mmiri a gbanyere n’udu na-ajụ oyi ma na-adịkwa mma n’ahụ. Mmiri a na-agbanye n’udu bụ mmiri e si na mmiri kute. Mmiri iyi, yaabụ mmiri e si na mmiri kute bụ mmiri dị ka chi siri ke ya. Mmiri e chutere echute na-enwe isi nke bụ ihe gosịrị na ọ dị ka chi siri ke ya. N’oge ahụ e ji udu echekwa mmiri, ị ńụọ mmiri, ahụ na-edo gị karịa ka ọ dị n’oge ugbu a. Otu o sila dị, akpatị njụoyi bụ usoro ọgbara ọhụrụ e ji echekwa mmiri n’oge ugbu a.

Ọ dịkwa mma n’ụzọ nke ya mana nsogbu o nwere bụ na ọ na-ajụ mmiri oyi karịa ka ahụ mmadụ chọrọ n’ụzọ dị otu ahụ, ọ na-akpata nsogbu dị iche iche. Mmadụ dịka mụ onwe m, anaghị m ańụ mmiri e ji akpati nyụoyi chekwa n’ihi na a na m enwe ọrịa oyi (pneumonia). Oge ọbụla m ńụrụ ya, ọ na-akpọdo m na ngụgụ ma na-egbu m mbgu. N’ihi ya, anaghịzị m ańụ ya.

GUO:  Uru na ọghọm udu mmiri na-eweta

  Ọzọ dị ka ibe ya bụ na mmiri a na-eji akpati njụoyi echekwa bụ mmiri ọgbara ọhụrụ a na-ańụ n’oge ugbu a. Ọ bụ mmiri a gbapuru agbapu (bore hole), onweghị oge ọ ga-adị ka mmiri iyi. Ya mere, e ji akọrọngwa ọgbara ọhụrụ bụ akpatị njụoyi echekwa mmiri ọgbara ọhụrụ.

Nwanyiaku Mmadụ – Oge e ji udu echekwa mmiri agaala. Ọ bụ eziokwu na mmiri dị na ya na-ajụ oyi dịkwa mma n’ahụ mana e nwere ike isi na ya nweta nje n’ihi na a na-amanye iko n’ime ya tupu ekuputa mmiri.

  Ọtụtụ oge ka a na-adọba udu ahụ debe iko n’elu ihe e ji kwuchi ya ma hapụ ya n’ihu ụlọ dị n’akụkụ ụzọ ebe ndị mmadị si aga. Ebumnobi e ji eme nke ahụ bụ onye mmiri na-agụ gafete, o kuru mmiri ńụọ. Ọ bụ eziokwu na ọ bụ ịhụnanya ka e ji eme ya mana ọdịghị mma ọha na eze iji otu iko ańụ mmiri. N’ụzọ dị otu ahụ, e nwere ike ikesa ọrịa.

  N’aka nke ọzọ, akpatị njụoyi na-echekwa mmiri n’ụzọ dịkwa iche. Mmiri a na-etinye na ya abụghị n’ụdị nke ọtụtụ ndị mmadụ ga-eji otu iko ańụ. Mmiri ahụ na-adịkarị n’ụdị onye chọọ o were nke ọ ga-ańụ.

  Ka ọ dị ugbu a, ndị na-emepụta mmiri na-agbanyezi ya n’ololo maọbụ n’akpa, onye chọọ mmiri, o were otu ńụọrọ onwe ya.

Uche Mbah – Ma udu na akpati njụoyi dịcha mma iji chekwaba mmiri ma otu ihe anyị ga-amata bụ na ọgbọ ọbụla nwere usoro obibi ndụ. Oge ahụ, ma nwata ma okenye na-akpachara anya n’ebe udu dị. I jiri udu chekwaa mmiri n’oge a, ụmụaka ga-akụwasị ya n’ihi elerughị anya ala. Ọgbọ a anaghị enwe ndidi, ihe ha chọrọ bụ ihe ọbụla ga-adịrị ha mfe.

GUO:  Uru na ọghọm udu mmiri na-eweta

  Ya mere iji udu chekwa mmiri dabara adaba ma ọdịghịkwa ire n’oge ugbu a n’ihi na ihe na-aga aga, ihe niile nwere oge.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here