Na Lagos, Ụka Katọlik enyela fada machiri ukwe Igbo n’ụlọụka ya ocheazụ

0
17
Fada Anelu

 ỤKA Katọlik, Achịdayọsis Lagos, enyela ụkọchukwu parish nke Holy Trinity Catholic Church, Ewu-Owa Gerigbe Ikorodu Lagos, Fada James Anelu ocheazụ maka ịmachi egwu Igbo na egwu olu dị iche iche (choruses) na parish ya.

  Achịbishọp Lagos, Most Rev Dr Alfred Martins, n’ozi nkatọ ‘disclaimer’ nyere ụkọchukwu ahụ iwu ka ọ nyegodu ohere ‘an indefinite leave of absence’.

  Fada Anelu ka e kwuru na ọ machịrị egwu Igbo na abụ olu dị iche iche na parish ya, ma kwuo na a ga-egbochilata otu ‘Ndigbo’ si awa anya.

  A chọpụtara na o ji iwe kwụsị ukwe/abụ na-akpalite mmụọ oge a na-enye onyinye nke ugboro abụọ, ma kwuo na ndị Igbo agaghị anọgide n’ịwakpo ndị ọzọ anya na parish ya.

  E kwukwara na ụkọchukwu ahụ gara n’ihu rụtụ aka na dayọsis Benin, ebe ndị Igbo wagidere anya wee ruo na nke ịbụ bishọp.

  Otu o sila dị, o kwuru na mmụọ nke Chineke maara sọọsọ asụsụ ndị gbara parish ahụ gburugburu.

  Dịka ọ na-ekwuputa ozi inye ocheazụ ahụ, Achịbishọp Martins na leta o dere na Febụwarị 7, kwuru sị: “Ozi eruola anyị aka na Fada James Anelu, ụkọchukwu parish Holy Trinity Catholic Church, Ewu-Owa, Ikorodu, kwuru okwu ụfọdụ okwu adabaghị adaba gbasara egwu ndị Igbo a na-agụ n’ụlọụka tinyere okwu ekwesịghị ekwesị nke agbasoghị usoro otu ụmụnne si agburu na okpukperechi dị iche iche nke ụka Katọlik gbadoro ụkwụ na ya. N’ihi nke a, agwala ya ka ọ nyegodi ohere ka e nwee ike mee ezi nnyocha ihe niile gbasara ije ozi ya na parish ahụ. Ohere a ọ ga-enye malitere dịba ire na Tuzdee, Febụwarị 8, 2022, wee dịbazie, ma e mesịa.”

GUO:  Na Lagos, ọkụ ọgbụgba akpaala mkpamkpa n'ahịa Ladipo

  Otu o sila dị, Achịbishọp Martins kpọkuru ndị Katọlik ka ha kwụdosie ike n’okuwkue ma nọgidekwa n’ife Chineke dịka otu nnukwu asụsụ, omenala na agbụrụ onye si kewara.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here