N’Aguluezechukwu, Oyinatumba ahanyela Chinenyenwa n’aka Ikenna, ka ọ bụrụ nwunye ya

0
20
Ikenna na Chinenyenwa (n'etiti), tinyere nne na nna ha, ozugbo ha gbachara akwụkwọ

AGBAMAKWỤKWỌ bụ ihe omimi nke Chineke hibere site n’okike ụwa, dịka o kwuru sị na nwaanyị ga-ahapụ nne na nna ya gaa binyere di ya, ha abụọ abụrụ otu.

  Nke ahụ pụtara ihe n’Aguluezechukwu ka Ichie Godwin Ezeuko (Oyinatumba n’Aguluezevhukwu) hafere nwa ya nwaanyị, Bethel Chinenyenwa Ezeuko n’aka Cyril Ikenna Izundu ka ha abụọ bụrụzie dinanwunye.

 Oke emume ahụ nke jikọtara ezinaụlọ Ichie na Lolo Godwin Ezeuko na Maazị na Oriaku Cyril Ubadili Izundu (Lord Marshal), bụkwa ndị Aguluezechukwu, okpuru ọchịchị Aguata na steeti Anambra, ọnụ dara ụda dịka ndị mmadụ si n’ugwu na ndịdị wee bịa gbaa aka ebe n’alụmalụ ahụ.

 N’okwuchukwu ya n’aja Maasị dị asọ e ji wee jikọọ di na nwunye ahụ, nke ọtụtụ ndị ụkọchukwu sonyere na ya n’ụlọụka, St Peter’s Catholic Church, Agulezechikwu, Fada Efobi kpọkuru di na nwunye ahụ ka ha na-echeta Chineke oge niile n’ihe ọbụla ha na-eme na ndụ.Ọ gara n’ihu dọọ ha aka na ntị ka ha na-enwere onwe ha ndidi, ma na-eleghara ihe ụfọdụ anya, iji were nwee udo na agamnihu n’ọlụlụ dinanwunye ha.

 Emume oriri na ọṅụṅụ, tinyere ịgba nkwụ nwaanyị nke a nọ n’ezinaụlọ Ichie Ezeuko, Enugwu Aguluezechukwu wee me dara ụda. Nna nwata nwaanyị gbara akwụkwụkwọ bụ Ichie Ezeuko, Oyinatumba nabatara mmadụ niile ma kelee Chineke maka oke ụbọchị ahụ e jikọrọ Chinenyenwa na Ikenna ọnụ dịka dinanwunye. O ji ọṅụ na afọ ojuju wụsa ngọzị ya n’isi nwa ya nwaanyị na di ya.

O kwuru sị: “Ana m ekele Chineke maka ụbọchị taa. Ụnụ ga na-atụ egwu Chineke oge niile ka ụnụ wee nọgide n’ịma mma ya. Ana m ekpe ka o nye ụnụ ụmụ; ọmụmụ nwoke na ọmụmụ nwaanyị. Ụnụ ga-ahụ ụmụ na ụmụ ụmụ ụnụ, tinyekwara ụmụ ụmụ ụmụ ụnụ. Ihe ụnụ ga-eji zụ ụmụ agaghị akọ ụnụ.  Ọ ga-enye ụnụ ogologo ndụ na ahụike. Ụmụ ụnụ ga-ele ụnụ nka! “

N’okwu nke ha, nne na nna nwoke gbara akwụkwọ, Maazi na Oriakụ Izundu, tinyere Lolo Ngozi Ezeuko n’ajụjụ  ọnụ a gbara ha iche iche, kelere Chineke maka ihe niile ma kpọkuo ụmụ ha gbara akwukwọ ọhụrụ ka ha tụkwasa ya obi oge niile iji nwete amara ya n’ozuzu oke.

Ndị e ji okwu ha agba izu bịara oke mmemme alụmalụ ahụ gụnyere  Igwe Felix Ebelendu (Igwe Nnanyelugo n’Agụluezechukwu), ndị okpu mmeemmee wdg.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here