Ndị ndu ọhụrụ NUJ, Anambra akpọtụrụla onyeisi ANPC

0
20
Nnabuife (nke isii n’aka ekpe), Odogwu (nke ise n’aka ekpe), Oranye (nke ise n’aka nri) na ndị ọrụ ANPC ndị ozo, tinyere ndị ndu NUJ bịara njem ahụ

...Hibe amụma ime afa Nnabuife ka ọ dị ọkpụtọrọkpụ

NDỊ ndu ọhụrụ a họpụtara ka ha kpara ụgbọ Nigeria Union of Jounalist  (NUJ), ngalaba steeti Anambra na-aga n’ihu nke Dọkịnta Odogwu Emeka Odogwu nọ n’isi ya awụchaala n’ụlọọrụ Anambra Newspapers and Printing Corporation (ANPC), Awka, bụ ndị na-ebipụta akwụkwọ akụkọ National Light, Ka Ọ Dị Taa, Sports LightXTRA na Homeland, maka ụkpa ekele na oku ịkwado ha na-aga n’ihu.

  Onyeisi ANPC, Sir Chuka Nnabuife na ndị ọrụ ya nabatara ha nkeọma.

 N’okwu ya, Dọkịnta Odogwu gosipụtara afọ ojuju ya na ndị ọrụ ya nwere banyere nkwado ụlọọrụ ANPC nyere ha mgbe e mere nhọpụta ahụ nke ha ji turu ugo.

 O kwuru sị na ọ dị ihe ise ha ji bagide njem ahụ. Ya mere o kwuru sị: “Anyị bịara ebe a taa ikele ụnụ otu ụnụ si nye anyị nkwado oge a họpụtara anyị, n’akpaghị oke ọbụla. Anyị na-akpọkwa oku ka ụnụ nọgide n’akwado ọchịchị ọhụrụ nke NUJ.”

  Ọ gara nihu jaa Nnabuife ike maka ọrụ ọma ya n’ụlọọrụ ANPC nke gụnyere ihibe ọmarịcha ụlọọrụ ICT, agadaga ụlọezumezu,  ogige ịhụnanya bụ nke ọ kọwara na ọ bụbu ikpo ahịhịa n’oge mbụ. Ọ rụtụkwara aka na ezi mmekọrịta dị n’etiti ya na ndị ọrụ ya dị egwu ma bụrụkwa nke kwesịrị nṅomi.

 Odogwu kwukwara na Onyeisi ANPC kpara ike site n’ịkpọbata ndị ntorọbịa ka ha sonye n’ọrụ ma na-ahụkwa na ụmụakwụkwọ nọ mahadum na-abịa njem nleta na ya. Ihe ndịa niile ka ọ kọwara dịka onyinye si n’aka Chineke, dịka o toro ya maka ime ka akwụkwọ akụkọ National Light bụrụzie eji ama atụ ma zukwaa oke n’ihe niile; tinyekwara ịgbakwụnye ya akwụkwọ akụkọ ndị ọzọ.

GUO:  Ikwu na ibe ekeleela Chineke ka Nnabuife gbara afọ ọhụrụ

 Odogwu gara n’ihu kwuo sị: “Anyị chọrọ ịrịọ gị ihe pụrụ iche. Anyị chọrọ ime aha gị ka ọ dị ọkpụtọrọkpụ na NUJ Centre –  (NUJ Indoor Sports Centre), ebe ndị otu anyị ga na-abịa na-egwuri egwu dịka teniisi, nchọrọkọtọ tinyere egwuregwu ndị ọzọ niile a na-anọ n’ụlọ eme. Aha a ga-enye ya bụ: Sir Chuka Nnabuife Indoor Sports Centre.”

 Otu o sila dị, ha gwara ya na ọ ga-esonye dịka onye ga-agwa ha okwu n’ọgbakọ ‘retreat” ha ga-enwe ma kasikwaa ya obi maka ọnwụ nwanne ya nwoke, onye nke ọ na-akwado akwamozu ya n’ike n’ike.

 N’akụkụ nke ya, Editọ ANPC, Oriakụ Rose Oranye kelere ndị ọrụ NUJ ahụ maka ịkpọtụrụ ha dịka o kwuru sị: “Akwụ m n’ihu ụnụ ịsị ụnụ nnọọ. Chineke mere ka uche ya mezuo na steeti Anambra. Obi dị anyị ụtọ na ụnụ nọ ebe a. Tupu emee nhọpụta ụnụ gwara anyị ọtụtụ ihe, ma ka anyị si ahụta ya ugbu a, n’ime izuụka abụọ ụnụ egosila anyị ihe ụnụ ga-emenwu. Jisinụ ike.”

 Oranye gara n’ihu kpọkuo ha ka ha jiri iwu na-achị ha ‘constitution’ kpọrọ ihe n’ihi na ọ dị ezi mkpa; dịka o kwere ha nkwa na ụlọọrụ ahụ ga na-aga n’ihu ịkwado NUJ.

  N’okwu ya, Nnabuife kelere ha maka ịkwanyere ya ugwu pụrụ iche.

  O kwuru sị: “E si n’ọdụ ama ihe dị nkịta mma. Enwere m afọ ojuju na i bidoro tupu ịbanye n’ọrụ gosịpụta onyinye amara ịchị ọchịchị nke pụtara ihe. Ị hụrụ ọrụ ntaakụkọ n’anya ma nwekwaa onyinye ezi mmekọrịta n’ebe mmadụ ibe gị nọ. Ya mere, ị ga-enwe otu ndị ọrụ bụ ịgba.”

GUO:  ANPC amalitela ọmụmụ ihe gbasara ịgbakọ ego ndị lagoro ezumike

  Nnabuife gara n’ihu nye ha ndụmọdụ maka na onye buru mmadụ ụzọ sibe ite n’aka ya enwe mkpọmkpọ eku na mkpọmkpọ ọkụ. N’ihi ya, ọ gwara ya ka o kee nkwụcha ma dịkwa ike n’ọrụ. Ka ọ mata na ebumnobi ya bụ inwogharị NUJ n’ogo dị elu karịa.Ọ gara n’ihu kwuo sị na ha ga-agba mbọ hụ na gọọmenti na-esonye n’ihe ha na-eme.

 Ọ nabatara ije ha dịka o kwuru sị: “Egwuregwu na-adị m mma. Anabatara m atụmatụ ụnụ. Anyị ga-ekesi akwa ike n’ukwu banyere Press Centre anyị. Gbanụ mbọ ka e nwee ihe a na-eme na ya.”

  O kelere ha maka ịja ANPC ike ma gbakwaa n’anwụ ọrụ ọma ụlọọrụ ahụ rụpụtarala ma na-agakwa n’ihu.

  N’oge ọ na-enye ekele n’aha ndị otu ha, ojiego bụ, Ogemdị Ozoemena kwuru sị: “Otu NUJ steeti Anambra a nọ ebe a taa, nke Onyeisi Dọkịnta Odogwu nọ n’isi ya nwere afọ ojuju na mkparịtaụka anyị na ụnụ taa. Anyị ga-etinye ihe anyị nụrụ n’ọrụ dịka anyị na ụnụ ga-aga n’hu na-enwe ezi mmekọrịta. Daalụnụ.”

  Ndị so Onyeisi NUJ, Dọkịnta Odogwu Emeka Odogwu bịa njem ahụ gụnyere: Osota Onyeisi, Ngozi Obileri; Odeakwụkwọ, Aloysius Ofodile; Osote Odeakwụkwọ, Okechukwu Onuegbu; Ojiego, Ogemdi Ozoemene; Odeakwụkwọ banyere ego, John Ndu.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here