Ndị uweojii azọpụtala mmadụ atọ ndị ntọ zoro n’ime ọhịa Zamfara

0
16
Ndị ahụ a zọpụtàrà

MMADỤ atọ ndị ntọ jidere ma zoo n’ime ọhịa Kunchin Kalgo dị na steeti Zamfara abụrụla ndị nweere onwe ha, dịka ndị uweojii na ndị ọrụ nchekwa steeti ahụ zọpụtàrà ha n’ebe e zoro ha.

 Onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti ahụ, bụ Mohammed Shehu bụ ya kwupụtara nke a n’ozi ọ kụpụụrụ ndị nta akụkọ, bụkwa nke o sitere na ya kọwaa na ọ bụ oge ndị uweojii ahụ na-awagharị n’ime ọhịa ahụ na-achọ ndị omekoome na ndị e ji eji ka ha hụrụ ma zọpụta mmadụ ise ahụ, bụcha ụmụnwoke.

  Dịka ọ na-akọwa na ọ bụ n’okpuru ọchịchị ime obodo Tsafe ka ime ọhịa ahụ dị, o mèkwàrà ka a mara na mmadụ anọ n’ime ndị ahụ a zọpụtàrà bụ ndị sitere okpuru ọchịchị ime obodo Zuru, nke steeti Kebbi, ma bụrụkwa ndị a tọọrọ n’ogologo ụzọ awara awara ahụ siri Yankara gaa Tsafe. O kwukwazịrị na otu onye nke ọzọ bụ onye a tọọrọ na mpaghara okpuru ọchịchị ime obodo Kontagora nke steeti Niger.

  Maazị Shehu gàkwàzịrị n’ihu kwuo na ndị ahụ nọrọ mkpụrụ ụbọchị iri na otu n’ime ọhịa ahụ n’aka ndị ahụ tọọrọ ha. O mere ka a mara na ndị uweojii ahụ duru ha gaa ụlọọgwụ maka ilekọta ha anya oge ahụ a zọpụtachara ha, ma mechakwa, gbaa ha ajụjụọnụ banyere etu ha na ihe siri jee.

  O kwupụtara na Kọmishọna na-ahụ maka ndị uweojii na steeti ahụ, bụ CP Ayuba Elkanah mètèèrè ndị ahụ ebere oge ọ hụrụ ha, ọkachasị n’ihi ihe ha gabigara n’aka ndị ntọ ahụ n’ime ọhịa ebe ahụ e zoro ha.

GUO:  Nwoke kwasoro ụmụ ya iko n'Ogun abaala n'aka ndị uweojii

  Dịka ọ na-ekèle ndị ọrụ ya maka ezi ọrụ ahụ ha rụrụ, ya bụ onyeisi ndị uweojii kwèzịrị nkwà na site na njikọaka ụlọọrụ nchekwa ndị ọzọ dị icheiche, na ha ga-aga n’ihu ịrụsi ọrụ ike na ịgbasi mbọ ike, iji hụ na a zọpụtara ma tọhapụchaa ndị niile e ji eji na steeti ahụ.

  Ọ gwakwara ndị ntọ na ndị omekoome ndị ọzọ nọgasị na steeti ahụ ka ha sepụ aka n’arụrụala maọbụ kwakọrọ ngwongwo ha rie mbọmbọ ọsọ na steeti ahụ, maka na ụlọọrụ ya agaghị ezu ike, ruo mgbe ha memìlàchàrà akaọrụ ndị omekoome na steeti ahụ ma kwàlitekwa ezi ọnọdụ nchekwa tọrọ àtọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here