Onye na-anya ọgbatumtum agbagbuola onye otu ya maka efere osikapa

0
20

NJINJI jiri n’Aba, nke dị na steeti Abia, dịka otu onye ji ọgbatumtum achụ nta ego (ọkada) ji egbe gbagbuo onye otu ya n’ihi efere osikapa.

  Ya bụ ihe ka e kwuru na o mere n’otu ebe a na-ere ihe oriri chere were (mama-put) dị n’Uzomkpa ‘Street’ Owerri-Aba, n’okpuru ọchịchị Ugwunagba.

  Otu onye nọ ebe ya bụ ebelebe gburu gwara ndị ntaakụkọ na mmadụ abụọ ahụ na-anya ọgbatumtum, tinyere ndị otu ha ndị ọzọ bịara n’ebe ahụ a na-ere nri nke a maara ka ‘Nwayi-Mmogbo Spot’, ka ha rie nri, ka ha nọ n-eche ka e nye ha nri, otu onye ọzọ na-anya ọgbatumtum aha ya bụ Chinenye batara ebe ahụ ma kwuo ka e nye ya nri. N’ihi ya, otu onye a maara dịka Obereagu, onye ya na ndị otu ha ndị ọzọ nobu ebe ahụ na-eche ka e nye ha nri tupu Chinenye abata gwara ya na ha nọ ebe ahụ tupu ọ bata, ya mere na onweghị mgbe a ga-ebu ụzọ nye ya nri, tupu e nye ha.

  Dịka ya bụ onye si kwu, ka ha na-arụ ụka banyere nke ahụ, onye na-ere nri malitere nyebe ndị buru Chinenye ụzọ bịa nri, nke mere ka iwe wee ya.

  Ya mere, Chinenye malite tibe mkpu na-ekwu na ọ bụrụ na nwaanyị ahụ gaa n’ihu inye ndị ahụ nri, na ya ga-eweta nsogbu ebe ahụ.

  O kwuru sị: “N’oge adịghị anya, ha malitere lụba ọgụ. Ndị ọzọ na-anya ọgbatumtum tinyere aka kụba Chinenye ihe. A kụrụ ya ihe tinka kụrụ paanụ, nke mere na ọ lara n’ime ịjụọoyi na iwe. Ndị ọzọ ahụ ka nọ ebe ahụ na-eri nri oge mmadụ ji ọgbatumtum ọzọ buru ya wee bịaghachi. Obereagu hụrụ otu o siri dabata ebe ahụ n’ike ma yiri akwa mkpuchi (hooded overall outfit), wee chọọ ka ọ gbaa ọsọ, ma ọ gbara ya egbe n’ụkwụ. Dịka mmadụ niile na-agba ọsọ inyo, Chinenye bịara nso, gbaa ya egbe n’afọ, ma sorokwa onye ọgbatumtum ahụ butere ya pụọ.”

  Ozi ruru anyị aka kwuru na ndị mmadụ bu nwata nwoke ahụ gaa ụlọọgwụ ozigbo, ebe ndị dịbịa oyibo nọ kwuo na ọ nwụọla.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here