Otu a ga-esi gbochie mpụ na ụrụala

0
19

MPỤ na arụrụala bụ okwu akpụ n’ọnụ n’oge dị ugbu a. Ihe akwụkwọ nsọ kwuru n’akwụkwọ Timoti nke abụọ isi nke atọ, amaokwu nke mbụ wee ruo na nke ise (2 Timothy chapter 3: 1-5) mgbe ikpeazụ ahụ bụkwa ugbu a. Ihe arụ dị iche iche dịka nwanne igbu nwanne ya, nwa igbu nne na nna ya, izu ohi, nna idina nwa ya, igbu mmadụ, ịtọrọ mmadụ nara ego ma gbuo onye ahụ, iji mmadụ chụọ aja dị iche iche, ịmago nwaanyị elu n’ike, iji aghụghọ nara mmadụ ihe ya, ego maọbụ ala nakwa ihe ndi ọzọ, nwoke ime onwe ya ka nwaanyị.

  Oge ụfọdụ ị nụ maka ndị na-akpa nsị na ndị na-ata amosu na-egbochi ọganihu ndị mmadụ. Ihe arụ ndị a na ndị ọzọ akpọghị aha ha ebe a bụkwa ihe na-eme n’oge a.

  E kwuchaa ihe ndị a niile ma ekwughị otu a ga-esi gbochie ya, ị mara na ihe e kwuru ezughị oke. Mbụ, ndị ọrụ nchekwa niile dị n’ala anyị ga-ebili tinye anya na mmiri, ma kee ajị n’ume ka ihe ọjọọ ndị a kwụsị. Ha kwesịrị ịdị na-agagharị n’ogbe niile ka anya ha na-eru n’ebe ndị ntorobịa nọ maka na ha na-adị anọ n’ọhịa maọbụ ụlọ arụchabeghị arụcha na-ese anwụrụ ike ma na-emekwa mpụ dị iche iche.

  Gọọmenti n’aka nke ya akwadokwa ndị ọrụ nche otu o kwesịrị, ma nwee ndị maara ihe ga na-enyocha okwu ndị ntorobịa ọbụla pụtara. Gọọmenti wuo ụlọ kọmpịnị nakwa ụlọ ebe a na-emepụta ngwa ahịa maọbụ ngwa ọrụ ka ndị ntorobịa nwee ihe ha na-arụ nakwa ebe ha ga na-apụ kwa ụbọchị. Ka uche na anya ha nwee ihe ọ na-arụ nakwa ezigbo ihe ha na-eche, makana okwu Igbo siri na aka aja aja na ebute ọnụ mmanụ mmanụ.

  N’aka nke ọzọ, onye agụụ na-agụ bụ onye iwe na ewe (a hungry man is an angry man). Ụfọdụ bụ ndị gụsịrị akwụkwọ ma ha enweghị ọrụ, ebe ụfọdụ mụrụ ọrụ enweghị ego ha ji ebido ihe ha mụrụ; mgbe ahụ agụụ na iwe jekọọ, ọmụpụta mpụ, aghụghọ nakwa arụrụala dị iche iche. Oge ụfọdụ, enweghị ndidi na-eme ndị ntorobịa ị daba na mpụ na arụrụala ndị a.

  Ndị kpatara ego kwesịkwara itinye aka, ha na gọọmenti elebaara ndị ntorobịa anya site n’inye ha ọzụzụ n’ụzọ dị iche iche dịka ịzụ ahịa, ịzụ ọkụkọ, ịzụ ezi nakwa ụmụ anụ ndị ọzọ ya na inye ọzụzụ n’ọrụaka dị iche iche dịka ịkwa akwa, ịkpa isi, ịkpụ isi, ịmụ otu e si eme ncha e ji asụ akwa na nke e ji asa ahụ, ịmụ kọmputa nakwa otu e si emebe achịcha oyibo dị iche iche.

  Mgbe akụzichara ihe ndị a, e nye ha nkwado kwesịrị ka ihe ahụ a kuziri ghara ị bụ n’efu. A kwadosia ha, gọọmenti e wepụta ndị ga na-agagharị a mara ma ọbụkwa ihe e kwuru ka a na-eme.

  Ụzọ ọzọ a ga-esikwa gbochie mpụ na arụrụala bụkwa mmadụ ikwere ma nabata okwu akwụkwọnsọ maka na ebe udo na ịhụnanya dị, mpụ, arụrụala agaghị adịkwa ebe ahụ.

Site n’ụzọ dị otu a nakwa ezi ụzọ ndị ọzọ enweghị ike ikwu ebe a, mpụ na arụrụala a na-anụ kwa ụbọchị n’ala anyị ebelata.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here