Apịara m nwata ahụ ụtalị dịka o kwesịrị – Onyenkuzi pịagburu obere nwa na Delta

0
17

EMEKA Nwogbo, bụ onyenkuzi n’ụlọakwụkwọ Arise and Shine Nursery and Primary School, Asaba, onye ndị uweojii nwụchikọrọ maka iji ụtalị pịagbuo  obere nwatakịrị, Obinna Udeze dị ọnwa iri na iteghete (19 months), agọọla agụgọ na ọbụghị ụtalị ọ pịara nwata ahụ mere o jiri nwụ.

 N’okwu ọ gwara ndị ntaakụkọ na Tuzdee, Nwogbo kwuru na ọ ga-enwerịrị ihe ọzọ mere nwata ahụ jiri nwụ, dịka ọ na-akọwa na ọ nwụghị oge ọ na-apịa ya ụtalị. O kwuru na ya pịara ya ụtalị dịka e kwesịrị isi pịa obere nwa, na ya nyere ya ntaramahụhụ n’ihi na ọ kwara nwata ọzọ aka.

 Onyenkuzi ahụ kwuru sị: “Apịaghị m nwata ahụ ụtalị ganye n’ọnwụ.Apịara m ya ụtalị otu m kwesịrị isi pịa obere nwa ụtalị. Apịara m ya obere ụtalị, ole m nwere ike, egbughị m nwata ahụ. Ọbụghị m kpatara ọnwụ ya. Ha gaa nyochaa ihe a nke ọma. Apịara m ya ụtalị maka na ọ kwara otu nwata aka ma kụọ nke ọzọ ihe n’isi.”

 Oge ọ na-agwa ndị ntaakụkọ okwu, Kọmishọna ndị uweojii na steeti ahụ, Ari Muhammed Ali kwuru na a ga-eme nnyocha a na-eme onye nwụrụ anwụ iji chọpụta ihe gburu nwata ahụ.

 Otu o sila dị, akụkọ kọrọ na nwata ọnwa iri na iteghete ahụ nwụrụ n’ihi ọtụtụ ube ụtalị onye nwe ụlọakwụkwọ ahụ, Oriakụ Nwogbo na nwa ya nwoke, Emeka Nwogbo pịara ya na Monde Febụwarị 7, 2022.

 Obere nwata ahụ ka e kwuru na o koropụrụ ka a pịachara ya ụtalị, ebe akara ụtalị a pịara ya juru ya ahụ. Ọ nwụrụ ka ọ gachara abalị ise a pịachara ya ụtalị, n’ụlọọgwụ, Federal Medical Centre, Asaba, isi obodo steeti ahụ. Ka ọ dị ugbu a, gọọmenti emechiela ụlọakwụkwọ ahụ.

GUO:  Na Delta, ndị uweojii ejidela ndị otu nzuzo ebe ha na-anabata ndị ọhụrụ

 N’okwu nke ya, nne nwata ahụ na-akọwa na ha kechiri nwa ya aka na ụkwụ tupu ha pịaba ya ụtalị.

  Ka ihe siri gbata kwụrụ ugbu a, nwaanyị ahụ nwe ụlọakwụkwọ  na nwa ya nwoke, bụ ndị a tọhapụrụ ka a nwụchikọrọ ha na mbụ n’ihi nkwekọrịta ha na ezinaụlọ nwata ahụ,  abụrụla ndị a nwụchikọrọ ọzọ na Satọdee, ka nwata ahụ nwụchara. Ya mere, ha nọ n’aka ndị uweoji.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here