Bishọp Okoye ewerela ọnọdụ dịka onyeisi ụka Katọlik, dayọsis Nnewi

0
19

BISHỌP Jonas Benson Okoye bụ onye jibu ọkwa  ‘Auxillary Bishọp’ nke Dayọsis Awka buzi Bishọp Dayọsis Nnewi, ka Bishọp Hillary Paul Odịli Okeke bụ Bishọp izizi dayọsis ahụ lara ezumike.

 A mụrụ Bishọp Jonas Benson Okoye n’ezinaụlọ Maazị Patrick na Oriakụ Theresa Okoye, ndị Adazi Nnukwu. Ọ bụ na Kaduna ka a mụrụ ya ka ọnwa Jenụwarị dị n’abalị iri abụọ na ise, n’afọ 1963.

  O nwere ọkpụkpọoku ichi ụkọchukwu oge ọ na-agba odibọ maasị n’okpuru Fada Miniham, n’obichukw St Joseph’s Cathedral, Kaduna.

 Ọ malitere agụmakwụkwọ ukọchukwu na St Paul’s Seminary, Ukpor, n’afọ 1976/77, si ya gaa All Hallows Seminary, Onitsha.

 Ebe ndị ọzọ ọ gụrụ akwụkwọ tupu o chie ụkọchukwu gụnyere Bigard Memorial Seminary, Ikot- Ekpene bụ nke mechara bụrụzie St Joseph’s Major Seminary na Bigard Memorial Seminary, Enugu.

 Achịbishọp A.K.Obiefuna ji ọkwa dịka Bishọp Dayọsis Awka oge ahụ chiri ya ukọchukwu n’afọ 1992 na St Andrew’s Catholic Church, Adazi – Nnukwu.

 Dịka ụkọchukwu, ọ kọrọ n’ugbo Chineke n’ebe ọ dị ukwuu, na ngalaba dị iche iche.

  N’afọ 2002, e zigara ya maka ịgụ akwụkwọ n’obodo oyibo. Ya mere, ọ gụrụ na St Paul’s University, Ottawa dị na Canada (Cannon Law), Laterian University, Rome (Doctorate). O mere nke ọma n’ụlọakwụkwo ndị ahụ ma turu ugo mmụta lọta, n’afọ 2006.

 Ọ gara n’ihu na-arụkwa ọrụ dịka ụkọchukwu n’ogo dị iche iche. O jibu ọkwa ‘Judicial Vica,’ Dayọsis Awka tinyekwara, Okaikpe (Judge) n’Onitsha ‘Inter – Diocesian Ecclesiastical Tribunal’ site 2007 wee ruo na a họpụta ya dịka bishọp.

 Ọ rụrụ ọrụ dị egwu n’ụka. O nwetela ọtụtụ onyinye nkwanye ugwu ‘award’, dee akwụkwọ dị iche iche na ihe ndị ọzọ.

 Ọ bụ ka ọnwa Novemba 2021 dị n’abalị iteghete ka a mara ọkwa wee kwuputa na ọ bụ ya ga-abụzi bishọp nke Dayọsis Nnewi. Ya mere, ka Febụwarị afọ a bụ 2022 dị n’abalị iri, o weere oche.

  Ndị ụka Kristi  gọọrọ ya ọfọ ọma ma si ya rụrụ ọrụ Chukwu gaba n’ihu, na ọ ga-adịrị ya mma.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here