Ịhụ ụbọchị ịhụnanya (Valentine Day) ka emume ụwa niile na-eme

0
17

EMUME ụbọchị ịhụnanya (Valentine Day) bụ ozuru mba ọnụ, n’ihi na ụwa niile na-eme ya. Ọ bụ oke emume na-ada ụda, nke a na-eme afọ ọbụla ma ọnwa Febụwarị dị na 14.

  Akụkọ kọrọ na Valentine dị asọ bụ ụkọchukwu Katọlik nwụrụ n’ihi ịhụnanya o nwere n’ebe mmadụ ibe ya nọ. E gburu ya n’ihi ịhụnanya. N’ihi nke a, ụwa niile na-echeta ya ma were ụbọchị ya na-egosịrịta onwe ha ịhụnanya.

  Ọtụtụ ndị na-eme emume a n’ụzọ ziri ezi dịka o kwesịrị site n’inyere ndị ha ka mma aka n’ụzọ dị iche iche. Ezinaụlọ na-anọkọta ọnụ, rie, ńụọ n’ịhụnanya. Otu ahụ ka ọ dị n’ebe ndị ikwunaibe na ndị enyi nọ. Ụfọdụ na-aga n’ogige ndị enwe nne na nna, ụlọnga gosi ha ịhụnanya site n’ịzụkọtara ha ihe oriri dịka osikapa, ji, azụ, anụ tinyere akwa na ihe ndị ọzọ dị iche iche.

  N’aka nke ọzọ, ọtụtụ ndị ọzọ ma ndị ntorobịa ma ndị okenye ji emume ịhụnanya a akpa arụ dị iche iche gụnyere akwamio. A laala ọtụtụ ụmụnwaanyị n’iyi n’ihi emume a. Ụfọdụ ka a napụrụ ihe ha nwere n’ike, ebe ụfọdụ tufuru ndụ ha dịka nwoke duru ha pụọ maka emume ịhụnanya tụgharịrị gbuo ha, were ha gwọọ ọgwụ ego.

  Otu o sila dị, ọtụtụ mmadụ tinyere ọnụ n’okwu site n’ịkwuputa echiche obi ha banyere oke emume a.

Ngozi Mba – Amaghị m ihe ọbụla gbasara emume Valentine. Anaghị m emerube ya. Agara m n’ụlọọrụ m ebe m na-akwa akwa. Arụrụ m ọrụ ruo mgbede, laba n’ụlọ m. Ihe m ji ama ụbọchị Valentine bụ m nụ ka ndị mmadụ na-ekwu banyere ya; e wepụ nke a, agaghịm ama na ụbọchị ahụ bụ ụbọchị ịhụnanya dịka ha si akọwa. Esighi m nri pụrụ iche maka ya n’ihi na anaghịm emerube ya. Onweghị ihe pụrụ iche m mere ụbọchị ahụ.

Iyagalo Ruth – Obi anaghị adị m mma ụbọchị ọbụla a na-eme emume ụbọchị Valentine, n’ihi na ezigbo enyi m hụrụ n’anya nwụrụ ụbọchị ahụ kpọmkwem. Ya bụ ọdachi mere afọ asatọ gara aga, kemgbe ahụ, o ruo ụbọchị ahụ, ahụ ajụọ m oyi, ihe m ga na-echezi bụ maka enyi m ahụ lara mmụọ. Ya mere, anaghị m esonye n’emume ịhụnanya n’ihi ihe mgbu na uru m na-eruru ezi enyi m.

Muama Goodluck – Ama m banyere emume Valentine ma na-esonye na ya. Ọbụghị na m na-eme oke ihe pụrụ iche ụbọchị ahụ kama na ana m agọzi ndị mmadụ ma na-asị ka ụbọchị emume ịhụnanya ahụ dịrị ha mma. Na mbụ, mụ na di m na-ekele onwe anyị ekele ịhụnanya n’isi ụtụtụ tupu anyị apụọ. M garuo n’ụlọọrụ m, ebe m na-edozi ndị mmadụ isi, anyị ga na-akpa banyere ya.

Ọbụladị n’usoro nzikọrịtaozi ọgbara ọhụrụ (social media), ihe niile banyere emume ahụ na-ejuputa na ya. Ana m enwe mmasị ige ma na-ekiri ya. Emume a dịka m si ahụ ya ga-adigide, ọ ga-emechaa bụrụ oke emume karịa ka ọ dị ugbu a n’ihi na afọ ọbụla ka ọ na-abawanye karịa afọ ndị gara aga.

Ijeoma Okeke – Emume ụbọchị Valentine na-abụrụ m emume gbara mkpị. Ihe m ji ekwu otu a bụ na amụrụ m ada m nwaanyị ụbọchị emume ahụ. Ya mere, ka m na-eme emume ncheta ọmụmụ ada m, ka m na-emekwa emume ịhụnanya ụbọchị Valentine.

Ọ na-abụrụ m ihe oke ọńụ. Ma nke afọ a, ada m mere nke ya n’ụlọakwụkwọ. Akwadooro m ya ihe nke ọma site n’igote achịcha bekee (cake), mmanya ọtọ bịrịbịrị na ọtụtụ ihe ndị ọzọ na-adị ụmụakwụkwọ prịma mma. Ya mere, ụmụaka ibe ya sonyere ya wee ńụrịa.

Ihe ọzọ na-enye m ọńụ n’emume a bụ na ọ ga-eme ka ada m nwee ịhụnanya n’ebe mmadụ ibe ya nọ. Ọ tolite, ọ ga na-echeta ndị ọ ka mma, ndị ụwa na-atụ n’ọnụ w.d.g. O sitela na nwata na-eme emume ịhụnanya, ọ gaghị echefu ya echefu na ndụ ya n’ihi na e sitere na nwata gosi ya uru ọ bara.

  Dịka ncheta ọmụmụ ya bụ ụbọchị ahụ, ọ ga-enyere ya aka ime emume Valentine na-aga n’ihu afọ ọbụla.

Onyeka Joe – Emeghị m emume nke afọ a n’ihi n’ echi ka ọ ga-eme otu afọ nna m nwụrụ. Eji m oge a na-echeta nna m, n’ihi ya, enweghị m mmasị isonye n’emume Valentine a gara abalị olemole. Ka chi foro ụbọchị ahụ, akwadoro m gaba ọrụ n’ihi na abụ m onye ọrụ oyibo. Anọgidere m n’ụlọọrụ ruo na mgbede, wee laa n’ụlọ m.

Uche Uchenna – Emume Valentine dịka o siri dị bụ emume ịhụnanya. O kwesịrị ka onye ọbụla nyere onye ọ ka mma aka. Ọ bụrụ na m nwere ohere ụbọchị ahụ, agara m enyere ndị m ka mma aka, ọ kachasị ndị agaghị akwụghachi m ụgwọ.

Ọ bụrụ na i sie nri nye onye agbataobi gị, echi o sie o nyeghachị gị, n’ụzọ dị otu ahụ ọ kwụghachila gị ụgwọ. Ma nke kacha mma bụ inye onye agaghị akwụghachi gị. Dịka anyị mara Valentine bụ onye dị asọ, ụkọchukwu Katọlik. O biri ndụ ịhụnanya site n’ijikọ ndị agha eze machịrị ịlụ nwaanyị, ma mee ka ha bụrụ di na nwunye.

O mere nke ahụ ka ha ghara ibi na njọ ma ụwa tụgharịziri emume ịhụnanya nke onye nsọ Valentine ka ọ bụrụ ụbọchị akwamiko. Ya bụ ihe jọgburu onwe ya. Ụbọchị emume ahụ bụzi ‘Global Day of Sin’. Njọ a na-eme na ya mba ụwa niile karịrị akarị. Ihe ọjọọ a na-emezi karịrị nke Sodom na Gomora mere.

Ọtụtụ ụmụnwaanyị ka a na-egbu ụbọchị ahụ. Ana m enye ndị mmadụ ndụmọdụ ka ha chọọ ịhụ Chineke ka ha tụọ egwu Chineke maka na ụbọchị ikpe na-abịa. Chineke bụ ịhụnanya mana ọ na-ekpe ikpe mkwụmọtọ. Ọ ga-ekpe onye ọbụla ikpe ka ọrụ onye ọbụla ikpe ka ọrụ onye ahụ siri dị. Ahụ anyị bụ ụlọnsọ mụọ nsọ, ya mere abụmọnụ na-adịrị onye ọbụla metọrọ ya bụ ụlọnsọ.

Izuchukwu Okafor – Esonyere m n’emume ụbọchị Valentine nke ọma. Na mbụ, agara m ụka n’ihi na n’ụlọụka anyị Anglican Church of Redemption Parish, Awka,  na-ahazi emume a maka ndị ntorobịa, kụziere ha ihe ma nyekwa erimeri. Na mgbede, agara m mkpagharị ebe mụ na ndị enyi m nọ rikọrịta ma ńụkwaa.

  N’otu aka ahụkwa, ụmụnwaanyị abụọ Josephine na Ijeoma gbakwaa ama otu e si merube emume ịhụnanya ahụ n’ụlọụka ha, St Anthony’s Catholic Church, Ifite Awka na St Thomas Aquinas Catholic Church G.R.A, Awka; ebe a kuzịrị  ndị ntorobịa ihe gbasara ụbọchị Valentine, otu e si abanye n’alụmalụ ihe ha kwesịrị ịmata n’ime onye ha na ya  na-achọ ịlụ alụmalụ tupu ha banye n’ime ya, ma tinyekwara ihe ndị ọzọ maka alụmalụ. A gbara ama na e jiri oriri na ọńụńụ wee merube ya bụ emume ụbọchị ahụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here