Ịkwa ozu n’ala Igbo, oge gboo na oge ugbu a

0
22

NA mgbe gboo, ịkwaozu dị nfe n’ala Igbo. Mmadụ nwụọ ndị ezinaụlọ ya na eme mmemme akwamaozu ya oke aka ha ra. Oge ụfọdụ, onye nwụrụ enweghị ihe o debere, ụmụ ya enweghị ihe ha nwere, e gwuo ala lie ya ozigbo, ụmụnna agbaa izu mekọlata akwamozu ya makana onye ọzọ nwụọ, agaghị eme mmemme ọbụla.

  N’ezie, Igbo na-asụ n’olu n’olu ma ha kwaa ụkwara ọbụrụ ofu. Igbo kwenyere na onye nwụọ, ọ bụrụ na akwaghị ya, onye ọzọ nwụọ agaghị akwa onye nke abụọ nwụrụnụ.

  Ọ bụ ezie  na ihe e ji akwa ozu dị ukwu ma na ọbụ ka ndị si chọ ịkwa ozu ka ha ga- eji kwaa ozu ha maka Igbo kwuru sị na ọ bụ ka aka ha nwaanyị ka ọ na-atụkwasa di ya.

  Ụfọdụ obodo na steeti Anambra emeela ya ka ọ dị mfe site n’ibelata abalị olemole ha ga akwa ozu. Ụfọdụ mechiri isi nri. Ọ bụrụ na mmadụ kpatara ego, chọọ ịkwa nne, nna maọbụ nwanne ya, nke ahụ dị iche mana o kwesịrị ịbụ mgbe nne, nna na nwanne ya ahụ dizuru ụbọchị ndụ nke bụ nke ndị Igbo na-akpọ ozu oriri.

  Ọka mma mmadụ nwụọ, ụmụ ya na ụmụnne ya ghara ime dịka onye nke ọzọ siri me kama ka ha mee mmemme akwaozu ha ka aka ra ha makana ụka na mmepe emeela ka mmadụ ghọta na ọbụghị otu esi kwa mmadụ ka mma kama ọ bụ ka o siri bie ndụ ya n’ezi omume, eziokwu mgbe ọ dị ndụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here