Mmemme ịtụ ndo

0
18

NDỊ Igbo so n’agbụrụ na-eme mmemme dị iche iche. Mmemme ndị ahụ gụnyere ichi echichi dịka nze na ọzọ, ịgba nkwụ nwaanyị, akwamozu, ọńụ nwa w.d.g.

  A na-akwado nke ọma tupu e mee emume ndị ahụ, site n’iwekọta ihe ndị a ga-eji mee ya.

  Ya mere n’izu a, anyị ga-etụle otu ha si eme ka ndo dị ebe a na-eme mmemme. Ndo na-echekwa ndị mmadụ ka mmiri ozuzo maọbụ anwụ ghara imekpa ha ahụ. Ọ bụrụ na mmadụ emeghị ka ndo dị ebe ọ na-eme emume ọbụla, ị mara na emume ahụ akwụsịghị ike. Nke bụ ezi okwu bụ na ọ bụ ihe ndị ahụ a na-arụ ka e wee nwee ezi nchekwa banyere ndo na-ezipụta na e nwere mmemme n’ezinaụlọ ahụ.

  N’oge gboo, ihe e ji eche ndo ebe a na-eme mmemme bụ igu nkwụ. N’oge ahụ n’ụtụtụ ụbọchị a ga-eme mmemme maọbụ na mgbede ụnyaahụ ya, a ga-eji igu nkwụ rụọ ụlọ ole a chọrọ n’ezinaụlọ ahụ. A ga-arụ ya nke na ọ ga-enye ndị mmadụ ezi nchekwa.

  N’oge ahụ, ọ bụ ikwunaibe, tinyere ndị agbataobi na-aga gbutechaa igu nkwụ ma jiri ya rụọ ụlọ maka ndo n’anaghị onye ahụ na-eme mmemme ego. Ọ bụ ụmụikorobịa na ụmụnwoke gbasiri ike na-eme ya. Ha na-esi n’ụzọ dị otu ahụ nyere onye na-eme mmemme aka. E mechaa, onye ahụ nwere ike nye ha mmanya maọbụ tinyekwa ihe oriri, dịka aka ha ya.

  Ka e ji igu nkwụ rụkata ụlọ ndo maka mmemme, nke ọgbaraọhụrụ pụtara. A na-akpọ ya kanopi. Ọ bụ okporo igwe na rọba ka e ji rụọ ya. A na-agbazite kanopi agbazite (hire). Ọ bụ ego ka a na-enye ndị nwe ya tupu e buru ya gaa rụọ ụlọ ndo ebe a ga-eme mmemme.

  Ka a nọkatara, otu dị iche iche bidoro nwebe kanopi nke ndị mmadụ na-agbaziri. N’oge ahụ ị kwụọ ụgwọ abalị ole ị chọrọ ka ọ dịrị be gị, I buru gaa jiri aka gị mebe ihe dị na ya.

  Ma ka a nọkara e bidozire mebe na ị kwụọ ụgwọ, ndị ahụ nwe kanopi ejiri aka ha bute ya ma mee ya otu e kwesịrị isi debe ya n’ezinaụlọ ebe ahụ a ga-eme mmemme.

  E kwuru okwu sị na ụbọchị na-aga ihe a na-agbanwe, ihe ọhụrụ a na-apụta. Ya mere, ka ọ dị ugbu a o nwere ụdị kanopi ọgbaraọhụrụ ndị ọgaranaya na-edobezi ma ha na-eme mmemme; a na-akpọ ya ‘tent’ n’asụsụ bekee. Ụdị nke a na-adị nnọọ ka ime ụlọ. Ị gaghị anọ n’iro hụ onye nọ n’ime ya anya. A na-adonye njuoyi (air contidion) n’ime ya. Ọ na-ama mma dị egwu ma dịkwa oke ọnụ. Ogbenye anaghị arọ nrọ ịtụ ụdị ndo ahụ maka na okoro erughị eru wara ọgọdọ, ikuku buru ya o buru ọgọdọ ya. Ọ bụ ndị akajiakụ e nwere n’obodo ka a na-anabata n’ụdị kanopi ahụ.

  Ihe ọzọ dị ka ibe ya bụ na a na-achọ ụlọ ndo mma dị egwu n’oge ugbu a. A na-eji akwa mara mma na okooko tinyere ụmụ ihe na-egbuke egbuke chọọ kanopi mma nke na ọ na-adịzi ka sị hapụzie ya na mbara ebe e jiri ya mee mmemme.

  Ihe dịka mgbe a na-agba nkwụ nwaanyị, ụfọdụ na-eji ya arụrụ di na nwunye ụlọ pụrụ iche. Otu ahụ ka ọ dịkwa mgbe a na-akwa ozu. Ụfọdụ ezinaụlọ na-eji ụlọ ndo rụọrọ ozu ebe ọ ga-edina ka ndị mmadụ hụ ya anya ikpe azụ.

  N’ala Igbo taa, ọtụtụ ndị mmadụ jizi kanopi mere aka ọrụ nke bụ na ndị nwere mmemme na-abIa kwụọ ha ụgwọ ha ebugara ha ma kwesaa ya ebe ahụ.

  N’ụzọ dị otu a, ọtụtụ ejirila ihe gbasara kanopi baa ọgaranya site n’iji ya mepụta ihe a hụrụ anya dịka ịlụ nwaanyị, ịrụ ụlọ, ịzụpụta ụmụaka w.d.g. Ya mere, onye ọbụla nwere kanopi taa nke ndị mmadụ na-abịa na-agbaziri enweela aka ọrụ maka na agụụ agaghị agụkwa ya ọzọ, n’ihi na ndị Igbo bụ agburu na-eme mmemme oge nille maka na ha maara ihe ekwe na-akụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here