Nri ndị Igbo: Unejoko a hụrụ n’ọkụ

0
18

 OJOKO bụ nri ọtụtụ mmadụ n’enwe mmasi iri mana nri dị n’ime ojoko ma azụ ya bụ ọgwụ. Onye afọ na asa ọ na-enwe ike ọgwụgwụ, o rie ojoko a hụrụ n’ọkụ, nwa oge, o nweta ike na ume. E ji ojoko chara acha e si agwa, e jikwa ojoko chara acha eri osikapa ma e ghee ya eghe.

  Taa, anyị ga ekwu maka ojoko a hụrụ n’oku na otu e si eri ya. Ugbua, akụkụ ụzọ niile dị na obodo mepere emepe maọbụ n’ime obodo, ị ga-ahụ ndị n’azụ ahịa ojoko a hụrụ n’ọkụ. E ji izụ ahịa ojoko a hụrụ n’ọkụ azụ ụmụaka, e jikwa ya akwụ ụgwọ ụlọ na ọtụtụ ihe ndị ọzọ.

  Otu a ka ndị ji ya atụ mgbere si akwado ya. Ha sie agwa, o ghee nke ọma, ha ekponye unyi n’ihe e ji esi unyi, ha etinye ya ọkụ were ihe e ji amị anụ tụkwasi n’elu ọkụ ahụ, wụkwasa ojoko chara acha na nke achaghị n’ọkụ ahụ na-atụgharị ya ka ọ ghara ire ọkụ. O ghee, I wepụcha azụ ya, I bericha ojoko ahụ kịrịkịrị, kunye agwa na ya, tinye mmanụ, yabasi, nnu, ose, ị gwọkọọ ya nke ọma, wukwasi ya ụtazi I bere kịrịkịrị n’elu ya, ọ bụrụzie oriri.

  Ọ bụrụ na ịchọghị iji agwa rie ya, ị hụchaa ya n’ọkụ wepụ azụ ya, gbanye mmanụ, ose, nnu, yabasi, ụtazi na ụkpaka were suru ya. I richa ya, ị na-enwe ańụrị.

GUO:  Nri ndị Igbo: Ofe mpoto

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here