Ọgwụ ego: Ndị iwe juru obi agbaala mmadụ abụọ ọkụ n’Ogun

0
17
Ebe a gbara ndị ahụ ọkụ

IGBO sị na ọ bụrụ na a gbaghị ụzọ oweri mgba ọ naghị echi.

  N’ihi nke a, ndị ntorobịa iwe juru obi nọrọ na nsonso a wee mụọ mmadụ abụọ a na-enyo enyo na ha bụ onye ọgwụ ego ọkụ na steeti Ogun. Ya bụ nnukwu ihe nkiri bụ nke mere n’obodo Oja-Odan dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Yewa-North’ nke steeti ahụ.

  Dịka akụkọ siri kọọ, mmadụ abụọ ahụ a mụrụ ọkụ, bụ Idowu Afolabi na Johnson Adebiyi bụ ndị ụmụokorobịa jidere na mpaghara ahụ ka ha jigasị ákụ̀kụ̀ ahụ mmadụ e gburu ọhụrụ, wee kpụrụ ha nyefèé ha n’aka ndị uweojii, a kpọchie ha.

  Kaosiladị, égwú dàghàrịzịrị oge ọtụtụ ndị ntorobịa jìrì iwe wee wụchaa n’ogige ndị uweojii ahụ, wakpò ndị uweojii nọ n’ọrụ ebe ahụ, ma bàá n’ime ebe ahụ a kpọchiri ndị ahụ, dọpụta ha, tie ha gwoogwoo, ma gbaa ha ọkụ ozigbo n’ihu ogigè ndị uweojii ahụ, ma gbaa ha ọkụ ozigbo, ha wee ghọọ ntụ.

\  N’okwu ya banyere nke ahụ, onyeisi ndị uweojii na steeti ahụ katọrọ akparamagwa ahụ ụmụnwoke ahụ kpara, kọwaa ya dịka nke kọgburu onwe ya, ma mekwa ka a mara na ya agaghị anabàtazịkwa ụdị ihe dị etu ahụ ọzọ na mpaghara ebe ọbụla na steeti ahụ.

  Dịka ozi a kụpụrụ site n’aka onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii n’ime steeti ahụ, bụ Maazị Abimbola Oyeyemi siri kọwaa, ọ bụ oge ndị uweojii na-agba ndị ahụ e jidere ajụjụọnụ kà ndị ntorobịa ahụ wakpòrò ha, wee dọpụta ha iro, tigide ha ihe, tigbuo ha, ma mụọ ozu ha ọkụ.\

GUO:  Aka akparala nwoke ji akụkụ ahụ nwatakịrị o gburu gaa ịgwọ ọgwụ ego

  Ọ kọwara na onye a na-enyo ènyò ka bụ onye a na-enyo ènyò, wee ruo mgbe ụlọikpe kpechaara ikpe wee ma onye ahụ ikpe; ọbụladị dịka ọ dọkwara ndị mmadụ aka na ntị banyere igbu onye a na-enyo ènyò egbu, n’ihi na onye ọbụla mere ihe dị etu ahụ ọzọ ga-eji anya ya wee hụ ntị ya n’ejighị ènyò.

  Ọ gakwàzịrị n’ihu wee mee ka a mara na onyeisi ndị uweojii enyela ntụziaka ka e mee nnyocha miri èmì banyere okwu ahụ, iji chọpụta ma nwụchikọọ ndị so wee rụọ arụrụala ahụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here