Ọńụ dara ka Achịbishọp Okeke mere ncheta afọ iri abụọ o chiri nnukwu ụkọchukwu

0
17
Achịbishọp Okeke

ONYE nnọchianya Pope n’ala anyị (The Apostolic Nuncio of the Holy See to Nigeria) ma bụrụkwa ‘Permanent Observer Economic Community of West African States (ECOWAS), Achịbishọp Antonio Guido Filipazzi, ndị bishọp iri atọ na isii na ihe karịrị ndị fada dị narị anọ n’ọnụọgụ zukọtara n’obi Chukwu, Basilica Square of the Most Holy Trinity, Onitsha, maka emume afọ iri abụọ (20th anniversary) Achịbishọp Onitsha, Valerian Okeke ji chie nnukwu ụkọchukwu.

  Ebe ndị nnọchite nọchitere anya Achịbishop na bishọp iri atọ.

  Aka na-achị steeti Anambra bụ Gọvanọ Willie Obiano, gọvanọ a họpụtara ọhụrụ bụ Chukwuma Soludo, Sinetọ Uche Ekwunife tinyere onye ji otu ndọrọndọrọ P.D.P zọọ ọkwa gọvanọ, Valentine Ozigbo bịarakwara soro wee ńụrịa.

  Achịbishọp Fillipazi Nuncio ahụ, oge ọ na-enye Achịbishọp Okeke ngọzi emume ahụ toro ịtụmmamma (Eucharistic thanksgiving) ahụ ma kọwaa ‘Eucharist’ dịka ụka ịtụ mmamma maka Jesu Kristi, maka ekpere na arịrịọ maka mgbaghara.

  N’okwuchukwu ya, Bishọp Dayọsis Nsukka, Most Rev Igwebuike Onah kọwara Achịbishọp Okeke ka onye na-enye ekele ma nwee mmụọ ịnụ ọkụ dịka nnukwu ụkọchukwu.

  O toro ndụ Achịbishọp ahụ nke juputara n’ịhụnanya, ntụkwasaobi akụghị mmiri n’ebe uche Chineke dị, tinyere ndụ ekpere bụ nke o kwuru pụtagasịrị ihe n’ọrụ ya na ngalaba nkuzi na mgbazi ndị ntọrọbịa, ụlọọgwụ na ụlọnga ma tinyekwara ịkwado ndị ụkọchukwu nọ n’okpuru ya maka ọrụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here