Udeze akpọkuola ndị Igbo ka ha na-eri nri e jiri mara ha

0
18
Ụfọdụ ndị sonyere nà mmemme ahụ

A KPỌKUOLA ndị Igbo ka ha ná-eri nri dị icheiche e ji mara ndị Igbo, iji nye aka kwalite nchekwa ọnọdụ ahụike ha ma nyekwara ha aka ịgbanahị ụfọdụ ọrịa dị icheiche a na-arịagasịzị n’oge ugbua.

  Onyeisi Ọba Akwụkwọ Steeti Anambra, bụ Dọkịta Nkechi Udeze bụ ya kpọrọ oku a n’okwu ya na mmemme ọba akwụkwọ ahụ chịkọbàrà iji merùbe mmemme ụbọchị ọrịa kansa na mba ụwa, nke ahọ 2022.

  Mmemme ahụ bụ nke weere ọnọdụ na ngalaba ọba akwụkwọ steeti ahụ dị n’Ozubulu, dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Ekwusigo, ma bụrụkwa nke dọtara ndị nne, ndị nna, ụmụakwụkwọ na ndị ọrụ ọba akwụkwọ dị icheiche.

  N’okwu ya n’ebe ahụ, ya bụ onyeisi ọba akwụkwọ, Dọkịta Udeze kọwara na ebumnobi mmemme ahụ bụ iji gbasàá ozi, ma kụziere ọhaneze ihe ha kwesiri ịma banyere ọrịa kansa, ma gwakwa ha etu ha pụrụ isi wee gbanahị maọbụ gbòchie ya bụ ajọ ọrịa.

  Ka ọ na-akọwa isiokwu mmemme ahụ nke ahọ a, nke pụtara “Imechi Oghere Nlekọta Ahụ” (Closing the Care Gap), Dọkịta Udeze dụrụ ndị bịara mmemme ahụ ọdụ ka ha na-elekọta ndị ọrịa kansa nọ na gburugburu ma nyekwa aka n’ịgbasà ozi n’ime-ime obodo, n’ahịa na n’ezinụlọ ha dị icheiche. Ọ kọwakwara mkpa ọ dị ka ha na-akpọtụrụ dọkịta oge ọbụla ha hụtara ihe dị añaa n’akụkụ ahụ ha ọbụla.

  Na nkụzi o nyere na mmemme ahụ, Dọkịta Ijezie Arinze nke ngalaba ‘General Surgery Unit’ nke ụlọ ahụike nkụzi Mahadum Nnamdị Azikiwe dị na Nnewi kọwàrà ihe ọrịa kansa pụtara, mee ka a mara na onye ọbụla nwere ike ịrịa ọrịa kansa, n’agbànyèghị ahọ ole onye ahụ dị maọbụ, maọbụ ụdị ego o nwere.

GUO:  Ọba akwụkwọ Anambra na NDLEA emeela ụbọchị ibu agha megide ọgwụ ike

  Ọ kọwara na ọrịa kansa nwere ike ime mmadụ n’akụkụ ahụ ọbụla, ma gakwazie n’ihu kpọpụtasịa ụfọdụ ihe dị icheiche nwere ike itinye mmadụ n’ajọ ọnọdụ ibute ọrịa kansa, ya na ihe dị icheiche e ji ama na ọrịa ahụ eburula bata.

  Dịka ọ na-akpọpụtasị ndị ọrịa kansa dị icheiche e nwere nàkwà akụkụ ahụ ebe ha na-emegasị, Dọkịta Arinze kọwàrà na kansa nke na-eme n’ara bụ ụdị nke a kacha ahụta ma bụrụkwa nke kacha egbu mmadụ ka ọkụkọ ma na mba ụwa, ma n’ala Nigeria.

  O mere ka a mara ụdị ọgwụgwọ dị icheiche e nwere nakwa usoro dị icheiche a pụrụ isi memilaa ọrịa kansa, ma gwakwazie onye ọbụla ka ọ gba mbọ na-enyòcha onwe ya nke ọma oge niile, iji mara ma ò nwere ihe dị añáā ọ ga-ahụta; ọbụladị dịka ọ kwukwara na ọ na-adị mma mmadụ ịga ụlọọgwụ maọbụ ịkpọtụrụ onye ọrụ ahụike oge ọbụla ọ hụtara ihe dị añaa n’ahụ ya, maka na ịchọpụta ọrịa kansa n’oge na-enye aka ime ka ọgwụgwọ ya dị mfe.

  N’okwu ha n’ótù n’otu, ụfọdụ ndị sonyere na mmemme ahụ, nke gụnyere Maazị Peter Ibeh nke ngalaba ọba akwụkwọ Ozubulu; obere nwaada Osakwe Ginika sitere ụlọakwụkwọ ‘Foundation Nursery and Primary School, Ozubulu’; na Oriakụ Agatha Ozuigwe, kèlèrè Ọba Akwụkwọ Anambra maka ụdị ọmarịcha ọgbakọ nkụzi ahụ, gbaa akaebe na ha mụtara nnukwu ihe n’ebe ahụ, ma kwekwazie nkwa ịgbasàwànyè ozi ahụ na ịkụziri ndị ọzọ ihe ha mụtàrà n’ebe ahụ, iji si n’ụzọ dị etu ahụ memìlaa ọrịa kansa.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here