Ụmụnwoke anọ ji ọgbatumtum site Enugu gaa ịgba nkwụ nwaanyị na Benue efuola

0
18

Ọ GBAGWOJURU ndị mmadụ anya ka ụmụnwoke anọ si fuo ka ha si steeti Ebonyi aga Benue.

  Ogonna Chukwu, 33; na nwanne ya, Sunday Chukwu 31; ọga ha, Chinedu Nwaite, 30, na enyi ha nwoke, Tochukwu Ekuma, 30, bụcha ndị Isiama Onitcha Igboeze dị n’okpuru ọchịchị Onicha na steeti Ebonyi bụ ndị ahụbeghị anya ọzọ kemgbe Disemba 26, 2021, dịka ha pụrụ ma gaba emume ịgba nkwụ nwaanyị nwanne (cousin) ha n’Okpa-Ogene nke dị n’okpuru ọchịchị Oju, steeti Benue. Nne ụmụ nwoke abụọ ahụ na-efu efu, Oriakụ Lydia Chukwu bụ onye Oju,kwuru ha ji ọgbatumtum agbụọ aga ebe ahụ.

  Ezinaụlọ ahụ, gụnyere nne na nwunye ha akwaala arịrị ụdị ahụhụ ha na-agabiga kemgbe ụmụnwoke ahụ furu.

  Oriakụ Goodness Chukwu, nwunye Ogonna gwara ndị ntaakụkọ na kemgbe ahụ na ụmụ ya dị atọ n’ọnụọgụ na-ajụ ajụjụ banyere nna ha.

  Ya mere, nwaanyị ahụ dị afọ iri abụọ na iteghete, ma dịrịkwa ime kpọkuru gọọmenti ka ọ gbata ọsọ enyemaka na ya bụ okwu ka ha ghara ịghọ ajadu na nwata.

  N’akụkụ nke ya, Success Chukwu onye dị ya bụ Sunday Chukwu na-efukwa efu kọwara na ọnọdụ ahụ etinyele ha na gbagharịa dịka ọ gaferela otu ọnwa di ya na ndị ọzọ ahụ jiri wee fu.

  Nwaanyị ahụ, onye gbara afọ iri abụọ ma na-enyekwa nwa ara kwuru sị: “Ihe a akarịala otu ọnwa, ma anyị anubeghị olu di m, anyị agaala na nke ndị uweojii ọtụtụ oge, ma onweghị isi. Kemgbe ahụ, ihe anaghị adịrị m mfe, agụụ anaghị agụzi m, ụra anaghị agazị m n’anya ma n’ehihie ma n’abalị. Ya bụ ọnọdụ, na-emetutazi nwa m ku n’aka dịka ọ malitere na-ata ahụ.” 

  Success, onye nke na-amụ ọrụ ịkwa akwa kwuru na ọnọdụ amaghịzị kwụrụ n’ebe ya na nwa ya gbara ihe dịka ọnwa ise nọ kemgbe ahụ di ya furu efu.

  Goodness Chinedu, onye na-arụ ọrụ idozi isi, ma gbaa afọ iri abụọ na abụọ kwuru na okwebeghị ya nghọta banyere ofufu di ya bụ Chinedu Nwaite bụ otu onye n’ime ụmụ nwoke ahụ na-efu efu.

  O kwuru sị; “Peter na Sunday (ndị ahụ na-efukwa efu) bụcha ụmụnne m nwoke ndị tọrọ m. Abụ m nwaanyị Chinedu Nwaite ka ọ lụrụ ọhụrụ. Nke a gosịrị na ọbụ m ka ọ kacha metụta, ụmụnne m nwoke abụọ na di m na-efu efu. Ọ bụ n’ihi ya ka m ji akpọku gọọmenti n’ogo ọbụla na ndị mmadụ o metụtara n’obi ka ha gbatara anyị ọsọ enyemaka, ka e nwee ike wee chọta ụmụnne m na di m.

  Nwaanyị ahụ, onye kwuru na ya bụ nsogbu so n’ihe mere ka nna ya nwụọ ka nne ya bụ Lydia nwee ihe iche aka mgba banyere ahụike ya. Dịka o siri kwu, ya bụ nwaanyị ajadu nọzị n’ọnọdụ ịńụ ọgwụ ugbu a.

  N’okwu nke ya, Chief Ogbonnaya Ekuma, nna otu onye n’ime ndị ahụ na-efu efu bụ Tochukwu kwuru na ya bụ ihe ka juru ya anya. Ọ kọwara na ha emeela mkpesa banyere ofufu ndị ahụ n’ụlọọrụ mgbasaozi gụnyere redio, tiivii, akwụkwọ akụkọ na usoro nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ (online).

  N’akụkụ nke ya, okwupụta okwu ndị uweojii steeti Ebonyi, Loveth Odah kwuru na kọmandi ahụ agbasaala ozi banyere ndị ahụ na-efu efu ma na mbọ niile a gbara iji chọta ndị ahụ na-efu efu, wee ruo mgbe ozi ruru anyị aka, enwebeghị isi.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here