Ihe mberede okporoụzọ na otu a ga-esi belata ya

0
16

Uchenwa Mba

IHE mberede dị ọtụtụ. E nwere ihe mberede ụgbọala, e nwere ihe mberede ụgbọelu, e nwere ihe mberede ụgbọoloko, e nwere ihe mberede ụgbọmmiri, e nwere ihe mberede ụlọ ị dagbu mmadụ, ihe mberede anụọhịa maọbụ anụ bi na mmiri ị dọgbụ mmadụ, ihe mberede ọkụ ọgbụgba nakwa ihe mberede mmiri I buru mmadụ.

  Oge ụfọdụ, ihe na-ebuta ihe mberede ndị a bụ mmadụ akpachaghị anya ya nke ọma nakwa mmadụ amaghị uru ndụ bara.

  N’ihe mberede ndị a niile, anyị ga eleba anya n’ihe mberede okporoụzọ. N’ezie, ihe mberede okporoụzọ jọrọ njọ, ọdịghị mma ka ọ dabara mmadụ ọbụla. Ma n’ihi na ọ bụ ihe amaghị ka a ga-esi gbochie ya kpamkpam, o kwesịrị ka mmadụ niile tinye uche ma kpachapụ anya nke ọma ka ọ ghara ihe ịbụ ga na-eme mgbe ọ bụla.

  Ihe ndị na-ebute ihe mberede bụ ndị na anya ụgbọala a dịghị akpachpụ anya otu o kwesịrị, ofe ụfọdụ ha eburu ụgbọala adịghị mma pụta okporoụzọ, ụfọdụ ańụọ mmanya na-aba n’anya, ụfọdụ adịghị erubere iwu okporoụzọ isi, oge ụfọdụ ndị ntorobịa ańụọ ma sekwaa anwụrụ ike dị iche iche tutu ha abaa ịnya ụgbọala, ha na ebukwa ụgbọala a dịghị mma pụta n’okporoụzọ. Oge ụfọdụ ha ebunye ụgbọala ibu karịrị ya, ụfọdụ abụrụ e nweghị ndidi.

  Ma nke ọbụla n’ime ihe mberede ndị a, ọdịghị nke dị mma maka na o mee onye na-anya na onye e bu n’ụgbọala, ma onye na-aga n’okporoụzọ na-ahụju anya. Ọ na-edula ọtụtụ mmadụ ala mmụọ, ma ọbụ onye ahụ anọrọ n’ihe ndịna ọtụtụ ahọ. Ụfọdụ o mee onye ahụ enweghị aka ma ọ bụ ụkwụ.

  Otu a ga-esi belata ihe mberede okporoụzọ, nke mbụ, mmadụ ịkpachapụ anya ya nke ọma mgbe ọ na-anya ụgbọala, irube iwu okporoụzọ isi. Ndị ọrụ na-ahụ maka ihe a na-anya anya ekwela ka ndị mmadụ buru ụgbọala adịghị mma pụta okporoụzọ. Onye e nwetara ọ bụghị ị nay a ego kama ka e buru ụgbọala ahụ gbụkaa ya.

  Gọọmenti kwesịkwara ileba anya n’okwu a bụ ihe mberede okporoụzọ maka na ọ na-asọ anya oyi ma o mee. Gọọmenti ga-eme ka iwu ịnya ụgbọala sie ike nke ukwuu ka a ghara itufu ndụ ndị mmadụ n’okporoụzọ mgba na mgbe ọbụla.

  Ọzọkwa bụ ka gọọmenti dozigasịa okporoụzọ ya na ide akara n’okporoụzọ dị iche iche n’ala anyị.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here