Na Plateau, a kpụpụla nwa mahadum gburu enyi ya nwaanyị ụlọikpe

0
15

A KPỤPỤLA nwoke gbara afọ iri abụọ na abụọ aha ya bụ Moses Okoh ụlọikpe, Plateau State High Court maka igbu enyi ya nwaanyị gbara afọ iri abụọ, Jennifer Anthony.

 Okoh, nwaakwụkwọ University of Jos, ka e kwuru na ọ kpara arụ ahụ na Disemba 31, 2021; oge o gburu Jennifer ma ghụpụ ya anya na akụkụ ahụ ndị ọzọ.

 Onye uweojii okwu dị n’aka (prosecutor), Inspektọ Alex Muleng gwara ụlọikpe ahụ na nwoke ahụ ratara enyi ya nwaanyị ka ọ bịakwute ya na Jos ka ha wee banye afọ ọhụrụ ma a maghị na ebumnuche ya bụ imemila ya.

 Muleng kwuru na o wepuru ekwentị ya ma mebie ya oge ha abụọ nọ ka o wee kwụsị ya ịkpọ oku maka enyemaka.

 Ọ kọwara na ọ bụ ihe e ji eri nri ‘fork’, ka o ji ghụpụta anya nwata nwaanyị ahụ lara mmụọ ma were mkpụrụ ụkwụ ya kụrie isi ya n’ala, nke mere o jiri nwụ.

 Onye uweojii ahụ gara n’ihu kwuo na nwoke ahụ gbara ọsọ si ebe ọ kpara arụ ahụ pụọ, ma ndị uweojii steeti Benue nwụchikọrọ ya na Jenụwarị 15, ebe o zoro.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here