Ụmụnwaanyị ASA-USA etinyela mmadụ 15 n’amụmà nchekwa ahụike Anambra

0
15
Ndị òtù ASA-USA na ụfọdụ ndị ahụ ha debanyèrè aha ha n'amụmà nchekwa ahụike ahụ

NGALABA ụmụnwaanyị nke otu ahụ jikọtara ụmụafọ steeti Anambra bi na mba ‘United States of America’ (ASA-USA) edebànyela aha mmadụ iri na ise na-arịa ọrịa kansà n’amụmà nlekọta ahụike steeti Anambra, bụ ‘Anambra State Health Insurance Scheme’, ka ha bụrụzie ndị ga na-anata ọgwụgwọ na nlekọta ahụike n’efù.

  Mmadụ iri na ise ahụ bụ ndị a nọrọ n’ụlọ ezumezu ‘Obiofia Village Hall’ dị n’Amichi, n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Nnewi South’ nke steeti Anambra wee nye akwụkwọ ikike ha ga-eji na-anata ọgwụgwọ n’efu n’ụlọọgwụ na n’ogige nlekọta ahụike dị icheiche ha tinyere.

  Ọ dị ncheta na ndị otu ahụ nọrọ n’ọnwa Disemba ahọ gara aga wee debànyekwa aha mmadụ iri ise na asaa ọzọ n’amụmà ahụ maka ịdị na-anata ọgwụgwọ n’efu.

  N’okwu ya n’ebe ahụ, Kọmishọna na-ahụ maka ihe na-emegasị na mba ofesi, ihe e ji aka emepụta, omenala na njem nlegharịanya, bụ Dọkịta Kenneth Anierobi kọwara ya bụ ọrụ ọma ndị òtù ahụ rụrụ dịka nke magburu onwe ya, ma bụrụkwa nke dabàrà adaba n’ọkpụkpọoku ‘Akụ Ruo Ụlọ’ ahụ ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ na-akpọ, bụkwazị nke ọtụtụ ndị mmadụ na otu dị icheiche na-agbasò wee na-ewèlataru akụ ha ụlọ.

  Dọkịta Anierobi kwupụtara olileanya o nwere na ya bụ amụmà ga-adịgide site n’ezi kwàdo gọọmenti na-enye ya, ya na etu ọtụtụ ndị mmadụ si esonye na ya; ọbụladị dịka ọ kpọkuru ndị ọzọ bụ ndị aka ji akụ nà òtù dị icheiche ka ha ñomie ezi ọrụ ahụ ndị òtù ASA-USA na-arụ site n’ịkwàdòkwù ndebanye aha ọtụtụ mmadụ, iji hụ na ndị Anambra nwere ezi ọnọdụ ahụike.

  O kelekwazịrị ndị òtù ahụ kwadoro ndebànye aha ụmụnwaanyị ahụ maka afọọma ha nakwa ọrụ obi ebere ha, ma kpekwazie ka Chineke gaa n’ihu ịgọzi ha, inye ha ahụ ike na ibuli ha elu n’ihe dị icheiche ha na-eme na mba ofesi ahụ.

  Na ntụnye nke ya, onyeisi ụmụnwaanyị ASA-USA na Nigeria, bụ Dọkịta Vero Okechukwu fọrọ ekele n’ụkpa wee bunye Gọvanọ Obianọ maka igùzòbè na ịkwàdò atụmatụ ahụ, bụ nke nyegokwara ha ohere ịtụnye ụtụ n’ịkwalite ọnọdụ ahụike ụmụ mmadụ, ọbụladị dịka ọ dụkwàrà ndị ahụ ritere uru n’atụmatụ ahụ ka ha gba mbọ na-aga ụlọọgwụ mgbe niile maka ịnara ọgwụgwọ na inyocha ọnọdụ ahụike ha.

  N’okwu nke ya, onye na-ahụ maka amụma ahụike ASHIA n’òtù ụmụnwaanyị ASA-USA, bụ Oriakụ Ngozi Agajelu kpọpụtasịrị ọtụtụ uru dị icheiche dị na mmadụ idebànyè aha n’amụmà nchekwa ahụike ahụ, o mere ka a mara na ọ bụ ọchịchọ óbì Gọvanọ Willie Obianọ ịhụ na mmadụ ọbụla na ezinaụlọ ọbụla dị na steeti ahụ ga-esonye n’amụmà ahụ, bụzị nke mere ha ji agba mbọ inyere ụfọdụ mmadụ ọnọdụ dịịrị añáa aka ka ha sonye na ya bụ atụmatụ ma na-eritekwa ọmarịcha uru dịgasị na ya.

  N’okwu nke ha n’otu n’otu, ụfọdụ ndị soro rite uru na ndebanye aha ahụ, nke gụnyere Oriakụ Edith Okonkwo na Oriakụ Amaka Obidum kelere ndị òtù ahụ maka inye ha ọmarịcha ohere ahụ inweta ezi nlekọta ahụike n’efù, ma kpekwa ka Chineke kwụghachi ha mmaji kwuru mmaji.

  Dịka ha na-ekwupụta olileanya ha nwere na Gọvanọ nke na-abata ọhụrụ na steeti ahụ ga-enyekwu aka ịkwàdò na ịkwàlitè atụmatụ ahụ, ọ kpọkuzịkwara ndị ọzọ bụ ndị aka ji akụ na ndị ọnọdụ dịịrị mma ka ha nye aka kwàdo ndebanye aha ọtụtụ mmadụ n’amụma nchekwa ahụike ahụ, ọkachasị ndị enweghị ego ime ya n’onwe ha, ka ha wee soro ritebe uru nlekọta ahụike ahụ jupụtara na ya bụ atụmatụ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here