Enyela Osodieme onyinye nkwanye ugwu maka inyere ndị ogbenye aka

0
13
Oriakụ Obiano (nke ise n'aka nri), ndị Fada na ndị C.W.O. Basilica of the Most Holy Trinity, Onitsha, ozigbo ha nyechara ya nkwanye ugwu ahụ.

OTU ndị nne, Catholic Women Organisation (CWO), Basilica of the Most Holy Trinity, Onitsha enyela nwunye gọvanọ steeti Anambra, Dọkịnta (Oriakụ) Ebelechukwu Obiano onyinye nkwanye ugwu ‘award of excellence’ maka nsonye ọma n’ọchịchị, tinyere ọrụ ịhụnanya ya.

  Otu ụmụnwaanyị Katọlik ahụ, mgbe ha na-enyefe nwunye Obiano onyinye nkwanye ugwu ahụ kwuru na ọchịchị afọ asatọ Gọvanọ Willie Obiano nwetara ezi nkwado site n’aka nwunye ya, onye ji òtù ịhụnanya ya Caring Family Enhancement Initiative (CAFÉ) wee metụta ndụ ndị onweghị ka ọ ha, n’ụzọ dị mma.

  Tupu ha enye Oriakụ Obiano ‘award’, onyeisi CWO Basilica of the Most Holy Trinity, Onitsha, Oriaku (Pharmacist) Ify Onochie kọwara nwunye gọvanọ dịka onye kpara ike dị egwu, onye mmiri agaghị amachi nzọụkwụ ọma ọ zọrọ n’ọrụ ịhụnanya ma mee ka ụwa ghọta ihe gbasara ọrụ ịhụnanya.

  Ọ gara n’ihu kọwaa na nwunye gọvanọ ghara ike n’anwụ n’ilekọta ụmụaka ụmụnwaanyị ụwa na-atụ n’ọnụ, na ndị ajadu tinyere ndị nwere nkwarụ dị iche iche.

  Dịka ọ na-anabata onyinye ‘award’ ahụ, Oriakụ Obiano kwuru na o nwere ezi afọ ojuju maka ya bụ onyinye sitere n’aka ụmụnwaanyị nwere okwukwe dịka ndị CWO bụ ndị nọ n’afọ niile na-egosipụta ịhụnanya n’ebe ya na ezinaụlọ ya nọ. O kwuru na ọ na-enwe mmasị ka ya na ụmụnwaanyị na-emekọ ihe n’ihi ọrụ siri ike ha na-arụ n’ụka na mmepe obodo.

  Oriakụ Obiano kpọkuru otu ụmụnwaanyị ahụ ka ha ghara ịda mba n’ọrụ, ma rịọkwaa ha ka ha nyekwa onye ga-anọchi anya ya, nwunye gọvanọ a họpụtara ọhụrụ, Oriakụ nwunye Soludo nkwado dịka ha nyere ya, ka o wee nwee ike mee nke ọma.

  Oriakụ Obiano kwere nkwa na ọ ga-arụ ọrụ ọma CAFÉ na-aga n’ihu ma ha hafechaa ọchịchị; otu ahụ o si rụọ ya n’ime afọ asatọ ọ nọrọ n’ọchịchị dịka nwunye gọvanọ steeti Anambra.

  N’okwu nke ya, otu onye n’ime ndị kọmiti nhazi otu ahụ, Lady Rose Ekwenibe, dị na mbụ kọwaa na a hụtara Osodieme dịka onye ezi onye nkwado n’ọchịchị na onye na-agbatara ndị onweghị ka ọ ha ọsọ enyemaka, na ọ bụ n’ihi ya ka e ji họpụta ya ma nye ya onyinye ‘award’ ahụ.

  Ọ gara n’ihu kwe ya nkwa na ụmụnwaanyị Anambra kwụ ya n’azụ n’ihe ọbụla ọ ga-eme n’ọdịnihu.

  Ndị nọ n’emume ahụ gụnyere kọmishọna na-ahụ maka ọ dị mma ụmụaka na ụmụnwaanyị na steeti Anambra, Lady Ndidi Mezue na ndị nọchitere anya Rektọ Basilica Fada Christogonus Ibemere na Fada Megwalu.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here