Na Congo, nwoke alụọla ụmụejima atọ otu ụbọchị

0
13

OTU nwoke gbara afọ iri atọ na abụọ, aha ya bụ Luwizo alụọla ụmụnne (ụmụejima atọ) aha ha bụ Natalie, Nadege na Natasha n’otu ụbọchị na Congo.

  Nwoke ahụ kọwara na ya na Natalie zụkọrịtara na nzikọrịta ozi ọgbara ọhụrụ ‘Facebook’, ya wee hụ ya n’anya ka ha malitere na-akparịta.

  Luwizo kọwara na ka ha abụọ zutere n’ihu na ihu, na ọ kọwaara ụmụejima ụmụnne ya, Nadege na Natasha onye ya bụ, ndị ahụ wee hukwuo ya n’anya.

  O kwuru na ọ tụrụ ya n’anya nke ukwuu ụbọchị izizi ya hụrụ ụmụejima ahụ n’ihi na ha yiri onwe ha nke onweghị ihe dị iche n’ime ha. Na ọ dị ya ka ọ bụ nrọ ka ọ na-arọ.

  N’ihi na ụmụejima atọ ahụ na-emekọta ihe ọnụ n’enweghị nkewa ọbụla, ha kpebiri ịlụ otu nwoke.

  Otu o sila dị, Luwizo kwuru na nne na nna ya enyeghị ya nkwado nke mere na ha abịaghị agbamakwụkwọ ahụ; na onweghị ihe nke ahụ mere, n’ihi na obi siri ya ike ịga n’ihu n’alụmalụ ahụ.

  O kwuru sị; “Ị ga-etufu ihe tupu inweta ọzọ. Onye ọbụla nwere ihe ọ chọrọ na otu o si eme ihe ya. Ya mere obi bụ m sọ ańụrị ịlụ ụmụejima atọ ahụ n’agbanyeghị ihe ndị ọzọ chere.”

  N’akụkụ nke ha, otu n’ime ụmụejima nwaanyị atọ ahụ kwuru sị: “Ọ kụjara akụja oge anyị gwara ya na ọ ga-alụ anyị atọ. Mana n’ihi na ọ hụla anyị n’anya, onweghị ihe ga-egbochi nzube anyị ebe ọ bụ na anyị onwe anyị hụkwara ya n’anya.

  Ọ bụ eziokwu na ndị mmadụ chere na okweghị omume ụmụnwaanyị atọ ịlụ otu nwoke; n’ebe anyị nọ, inwekọta otu ihe ọnụ bụ usoro obibi ndụ anyị kembe anyị bụ ụmụaka.”

  Ụmụejima atọ ahụ gbara akwụkwọ kwuru sị: “Taa, obi bụ anyị pọlịna pọlịna dịka ị siri hụ, n’ihi na nrọ anyị abịala na mmezu, n’enweghị nkewa ọbụla n’ihi ndị dị (husbands).”

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here