Nwoke egbuola enyi ya nwaanyị degaara nwunye ya ozi, gbukwaa onwe ya

0
14

OTU onye ọrụ ‘contractor’ na steeti Ogun, Hakeem Oladimeji, egbuola onwe ya ka o gbuchara enyi ya nwaanyị na mpaghara Bariga dị na Lagos.

  Oladimeji ka e kwuru na ya na ezinaụlọ ya bi na steeti Ogun mana ọ chọtaaara enyi ya nwaanyị ụlọ na mpaghara Ilaje Bariga nke steeti Lagos.

  Ya na enyi ya nwaanyị nwere nrụrịta ụka nke butere nghọtahie n’etiti ha. Na nghọtahie ahụ ka ha nọ, Oladimeji wee kụọ enyi ya nwaanyị osisi n’isi nke mere ka ọ daa ma nwụọ ebe ahụ.

  Ka ọ chọpụtara ihe o mere, nwoke ahụ dịka akụkọ siri kọ, buuru ozu enyi ya nwaanyị donye n’ụgbọala Toyota Sienna ya, nyara ụgbọala ahụ gaa n’ụlọ dị na steeti Ogun, ebe ọ dere ozi wee kọwaara nwunye ya ihe merenụ; ma nyarazie ụgbọala ahụ gaa n’ebe dị nso na ‘NASFAT Islamic Centre’ dị n’ogologo ụzọ awaraawara Lagos-Ibadan bụ ebe ọ kpọchibidoro onwe ya n’ime ụgbọala ahụ, nke ozu enyi ya nwanyị dị n’ime ya, wee gbuo onwe ya.

  Ọ bụ ndị na-agafe agafe chọpụtara na ozu mmadụ abụọ dị n’ime ụgbọala ahụ n’ihi isi nke si na ya apụta. Ya mere, a dọkpụrụ ụgbọala ahụ gaa n’ogige ndị uweojii Ibafo Police Station.

  Onye uweojii na-ahụ maka ọdịmma ha na ndị mmadụ na steeti Ogun, Abimbola Oyeyemi kwuputara na ya bụ ihe mere n’ezie ma kọwaa ihe banyere ọnọdụ ahụ.

  O kwuru sị: “Aha nwoke ahụ bụ Hakeem Oladimeji; ọ bụ ya na enyi ya nwaanyị ka a hụrụ ozu ha n’ime ụgbọala Sienna nke a kwụbara n’ebe mbata ogige NASFAT. Oladimeji bi na steeti Ogun, ma chọtara enyi ya nwaanyị ụlọ na steeti Lagos. Ha malitere ọgụ nke onweghị onye ma ihe kpatara ya, ọ kụọ enyi ya nwaanyị osisi n’isi, ọ daa. Ozugbo ahụ, ọ donye ozu ya n’ụgbọala ya, nyara ya gaa n’ụlọ ya, mana ndị hụrụ ya ka ọ na-adọnye ozu ahụ n’ụgbọala ya gara nye mkpesa n’ogige ndị uweojii, Ilajie Police Station dị na Bariga. Ka o ruru ụlọ, o debere nwunye ya ozi onye na-egbu onwe ya na-ede (suicide note) nke kọwara na ya egbuola mmadụ, ya mere na ya na-aga igbu onwe ya, na ya agbakerila ala ịchọba ya.”

  N’ikpeazụ, okwuputa okwu ndị uweojii ahụ kọwara na ka nwoke ahụ buru ozu enyi ya nwaanyị n’ime ụgbọala ya kwụsị ebe dị nso ebe e si abata NASFAT Islamic Centre, na ọ wepụtara ọgwụ ụmụ ahụhu (insecticide), gbalie ugogbe ụgbọala ya, ńụọ ya, wee nwụọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here