Obiano agbapeela ụlọ ezumeezu Anambra, nye ọtụtụ onyinye nkwanyeugwu

0
13
Aka na-achị steeti Anambra, Gọvanọ Willie Obianọ (nke mbụ n'aka ekpe), Oriakụ Ebelechukwu Obianọ (nke abụọ n'aka ekpe), na ụfọdụ ndị ọzọ sonyere nà mmemme ahụ

Ọ KPỌTỤRỤ akpọtụ ma zụọ azụọ na ụnyaahụ, dịka aka na-achị steeti Anambra, bụ Gọvanọ Willie Obianọ gbapere ọmarịcha ụlọ ezumeezu mba ụwa ahụ ọ rụrụ bụ ‘International Conference Centre (ICC)’.

  Ya bụ mmemme wééré ọnọdụ n’Awka bụ nke dọtara ọtụtụ ndị dị icheiche e ji okwu ha agba izu na steeti ahụ na mpụga ya, ma bụrụkwa nke Gọvanọ Obianọ nọrọ na ya wee nye ọtụtụ ụmụafọ steeti ahụ onyinye nkwanyeùgwù, n’ihi ntụnye dị icheiche ha megoro n’ịkwalite ùgwù, udo, ọganihu na ọnọdụ mmepe steeti ahụ.

  A nọkwara na ya bụ mmemme wee kpùghee akwụkwọ e dere ọhụụ banyere ndụ Gọvanọ Obianọ, ya na akwụkwọ ọzọ Maazị Ike Chioke dere banyere ọchịchị Gọvanọ Obianọ n’Anambra, bụ nke ọ kpọrọ ‘Akpokuedike, Duty Call in Anambra’.

  N’okwu ya n’ebe ahụ, Gọvanọ Willie Obianọ,  kpọpụtasịrị ụfọdụ ihe gbara ọkpụrụkpụ ọchịchị ya mepụtara, ma kelee ndị dị icheiche nyere aka ime ka ọchịchị ya gaa nke ọma.

  O nyere nkọwa banyere ụlọ ezumeezu ahụ na ụfọdụ akụrụngwa e jiri rụọ ya, bụkwa nke ga-abàta puku kwuru puku mmadụ otu oge, ma mekwa ka a mara ọtụtụ uru dị icheiche ya bụ ogige ga-abara steeti Anambra na ụmụafọ ya.

  Ụfọdụ ndị dị icheiche Obianọ nyere onyinye nkwanyeugwu na mmemme ahụ gụnyere eze ọdịnala Onitsha, bụ Igwe Nnaemeka Achebe; odeakwụkwọ izugbe Commonwealth n’oge mbụ, bụ Chiifu Emeka Anyaọkụ; onye Minista na-ahụ maka njem ụgbọelu na repọbịlịk nke mbụ, bụ Chiifu Mbazulike Amaechi; ụfọdụ ndị gọvanọ na osote chịbụrụ steeti ahụ oge mbụ, nke gụnyere Maazị Peter Obi, Dọkịta Chris Ngige, Virgy Etiaba, Maazị Emeka Sibeudu, Chiifu Emeka Offor, tinyere ọtụtụ ndị ọzọ.

GUO:  ASWAMA ewelitela aka n'ikwalite adịmọcha gburugburu - Akorah

  E nyekwara ụfọdụ ụmụafọ steeti ahụ lagoro mmụọ onyinye nkwanyeugwu, nke gụnyere Ọkammụta Dora Akunyili, Dọkịta Chuba Okadigbo, Dọkịta Nnamdi Azikiwe, Chiifu Emeka Ojukwu na ọtụtụ ndị ọzọ.

AHAPỤ A ZARA

Please enter your comment!
Please enter your name here